< Ekiliziastis 3 >

1 Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe. 2 Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu, 3 oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi, 4 oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu, 5 oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ, 6 oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi, 7 oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu, 8 oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo. 9 Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? 10 Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. 11 O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12 Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. 13 Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. 14 Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya. 15 Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ. 16 Ọzọkwa, achọpụtara m otu ihe nʼokpuru anyanwụ, na ọnọdụ ezi ikpe naanị mmebi iwu jupụtara, nʼebe e kwesiri inwe ikpe ziri ezi ị ga-achọpụta na ihe ọjọọ dịkwa ya. 17 A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.” 18 Echere m nʼobi sị, “Ebe mmadụ nọ, Chineke na-anwale ya, ka mmadụ mata na ha dị ka anụmanụ. 19 Nʼihi na ihe na-eche mmadụ na anụmanụ bụ otu. Ha abụọ na-eku ume, ha abụọ na-anwụkwa anwụ. Ọ dịghị ihe mmadụ ji karịa anụmanụ. Ihe niile bụ ihe efu. 20 Ha niile na-alaghachi nʼotu ebe; ọ bụ nʼaja ka ha si pụta, ebe ahụ kwa ka ha ga-alaghachi. 21 Onye pụrụ iguzo gbaa akaebe na mmụọ mmadụ na-ala nʼelu ma nke anụmanụ na-ala nʼaja?” 22 Nʼihi ya, ahụrụ m na ọ dịghị ihe ọzọ ụmụ mmadụ kwesiri ime karịakwa inwe ọṅụ nʼọrụ ha, nʼihi na nke ahụ bụ oke ha nʼebe a. Onye ga-eme ka ha bịaghachi hụ ihe ga-eme nʼazụ ha?

< Ekiliziastis 3 >