< Diuteronomi 29 >

1 Ndị a bụ okwu nke ọgbụgba ndụ ahụ Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu ka ya na ụmụ Izrel gbaa nʼala Moab na-agbanweghị ọgbụgba ndụ ahụ ya na ha gbara nʼugwu Horeb.
These are the words of the covenant which the LORD commanded Moses to make with the children of Israel in the land of Moab, in addition to the covenant which he made with them in Horeb.
2 Mosis kpọkọtara ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, Unu ji anya unu hụ ihe Onyenwe anyị mere nʼIjipt megide Fero, na ndị ozi ya, na ala ya niile.
Moses called to all Israel, and said to them: Your eyes have seen all that the LORD did in the land of Egypt to Pharaoh, and to all his servants, and to all his land;
3 Anya unu hụrụ oke nwale niile, na ihe ịrịbama ndị ahụ, na ọrụ ebube niile ahụ.
the great trials which your eyes saw, the signs, and those great wonders.
4 Ma tutu ruo taa, Onyenwe anyị enyebeghị unu obi nwere nghọta, na anya na-ahụ ụzọ, maọbụ ntị na-anụ ihe, nke ga-enyere unu aka ịṅomi ihe ndị a niile.
But the LORD has not given you a heart to know, eyes to see, and ears to hear, to this day.
5 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.
I have led you forty years in the wilderness. Your clothes have not grown old on you, and your sandals have not grown old on your feet.
6 Ọ dịghị achịcha unu riri, ọ dịkwaghị mmanya maọbụ ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya unu ṅụrụ. E mere m ihe ndị a ime ka unu mata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.”
You have not eaten bread, neither have you drunk wine or strong drink, that you may know that I am the LORD your God.
7 Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha.
When you came to this place, Sihon the king of Heshbon and Og the king of Bashan came out against us to battle, and we struck them.
8 Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.
We took their land, and gave it for an inheritance to the Reubenites, and to the Gadites, and to the half-tribe of the Manassites.
9 Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.
Therefore keep the words of this covenant and do them, that you may prosper in all that you do.
10 Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,
All of you stand today in the presence of the LORD your God: your heads, your tribes, your elders, and your officers, even all the men of Israel,
11 na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.
your little ones, your wives, and the foreigners who are in the middle of your camps, from the one who cuts your wood to the one who draws your water,
12 Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,
that you may enter into the covenant of the LORD your God, and into his oath, which the LORD your God makes with you today,
13 ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.
that he may establish you today as his people, and that he may be your God, as he spoke to you and as he swore to your fathers, to Abraham, to Isaac, and to Jacob.
14 Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,
Neither do I make this covenant and this oath with you only,
15 ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.
but with those who stand here with us today before the LORD our God, and also with those who are not here with us today
16 Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.
(for you know how we lived in the land of Egypt, and how we came through the middle of the nations through which you passed;
17 Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.
and you have seen their abominations and their idols of wood, stone, silver, and gold, which were amongst them);
18 Lezienụ anya ka unu hụ na obi onye ọbụla nʼime unu, nwoke maọbụ nwanyị, agbụrụ maọbụ ebo ọbụla nʼIzrel, esighị nʼebe Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nọ pụọ, bido chewe echiche ife chi ndị mba ọzọ ndị a niile. Lezienụ anya hụ na mgbọrọgwụ na-ewepụta nsi na-elu ilu dị otu a adịghị nʼetiti unu.
lest there should be amongst you man, woman, family, or tribe whose heart turns away today from the LORD our God, to go to serve the gods of those nations; lest there should be amongst you a root that produces bitter poison;
19 Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.
and it happen, when he hears the words of this curse, that he bless himself in his heart, saying, “I shall have peace, though I walk in the stubbornness of my heart,” to destroy the moist with the dry.
20 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agbaghara onye dị otu a! Iwe ya, na ekworo ya, ga-adị ọkụ megide nwoke ahụ. Ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a ga-abịakwasịkwa ya. Onyenwe anyị ga-ehichapụkwa aha ya, ka a ghara ịnụkwa ihe banyere ya nʼụwa.
The LORD will not pardon him, but then the LORD’s anger and his jealousy will smoke against that man, and all the curse that is written in this book will fall on him, and the LORD will blot out his name from under the sky.
21 Onyenwe anyị ga-akpa oke nʼetiti ya na ebo niile nke Izrel, maka iwetara ya mbibi, dị ka ọbụbụ ọnụ niile nke ọgbụgba ndụ nke e dere nʼime Akwụkwọ Iwu a si dị.
The LORD will set him apart for evil out of all the tribes of Israel, according to all the curses of the covenant written in this book of the law.
22 Mgbe ahụ, ụmụ unu ndị ga-eso unu nʼọgbọ ndị dị nʼihu, na ndị ọbịa si ebe dị anya bịa, ga-ahụ oke ihe otiti ọjọọ a bịakwasịrị ala a, ya na ọrịa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya.
The generation to come—your children who will rise up after you, and the foreigner who will come from a far land—will say, when they see the plagues of that land, and the sicknesses with which the LORD has made it sick,
23 Ala ahụ niile ga-abụ ala nnu, nke ọkụ repịara, ala nke a na-adịghị akụ ihe ọbụla nʼime ya, ala na-adịghị amị mkpụrụ, nke ahịhịa na-adịghị epu nʼelu ya. Ala dịka ala Sọdọm na Gọmọra, na Adma, na Zeboiim, nke Onyenwe anyị sitere nʼoke iwe ya mebie.
that all of its land is sulphur, salt, and burning, that it is not sown, doesn’t produce, nor does any grass grow in it, like the overthrow of Sodom, Gomorrah, Admah, and Zeboiim, which the LORD overthrew in his anger, and in his wrath.
24 Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”
Even all the nations will say, “Why has the LORD done this to this land? What does the heat of this great anger mean?”
25 Ọsịsa ya ga-abụ, “Ọ bụ nʼihi na ndị a hapụrụ idebe ọgbụgba ndụ ha na Onyenwe anyị, Chineke nke nna nna ha gbara, ọgbụgba ndụ ha na ya gbara mgbe o mere ka ha site nʼIjipt pụta.
Then men will say, “Because they abandoned the covenant of the LORD, the God of their fathers, which he made with them when he brought them out of the land of Egypt,
26 Nʼihi na ha fere chi ndị ọzọ ofufe, kpọọkwa isiala nye ha, bụ chi ndị nke ha na-amaghị, chi ndị nke ọ na-enyeghị ha.
and went and served other gods and worshipped them, gods that they didn’t know and that he had not given to them.
27 Ọ bụ ya mere iwe Onyenwe anyị ji dị ọkụ megide ala a, meekwa ka o zidata nʼisi ha ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a.
Therefore the LORD’s anger burnt against this land, to bring on it all the curses that are written in this book.
28 Nʼoke iwe ya na ọnụma ya ka Onyenwe anyị ji hopu ha site nʼala ha, werekwa ha tụba nʼala ọzọ, dịka ọ dị ugbu a.”
The LORD rooted them out of their land in anger, in wrath, and in great indignation, and thrust them into another land, as it is today.”
29 Ihe niile e zoro ezo dịrị Onyenwe anyị Chineke anyị, ma ihe ndị ahụ niile e kpughere ekpughe dịịrị anyị, dịkwara ụmụ anyị ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị nwee ike ịgbaso na imezu okwu niile nke iwu a.
The secret things belong to the LORD our God; but the things that are revealed belong to us and to our children forever, that we may do all the words of this law.

< Diuteronomi 29 >