< 2 Timoti 1 >

1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, dị ka uche Chineke si dị, na dị ka nkwa ndụ nʼime Kraịst Jisọs si dị,
Paulo n'tume ghwa Yesu Kristu kwa mapenzi gha K'yara, sabhwa ni ahadi sya uzima bhwabhujhele mugati mwa Kristu Yesu,
2 Nye gị Timoti, ezi nwa m. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị.
kwa Timotheo mwana n'ganwa: Neema, rehema ni amani kuhoma kwa K'yara Dadi jhitu ni Kristu Yesu Bwana bhitu.
3 Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.
Nikan'shukuru K'yara, ambajhe nikan'tumikila kwa nia jhinofu kama kyabhabhombili bhadadi jhangu, panikhomboka daima mu maombi ghangu. Kiru ni
4 Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.
pamusi ninoghela kubhona, ili kwamba nimemanyi ni furaha. Nikaghakhomboka mahosi gha jhobhi.
5 Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị.
Nikajha nikhombosibhwa kuhusu imani jha jhobhi halisi, ambajho apu kwanza jhatamili kwa mbuyuakhu Loisi ni nyinuakhu Yunisi. Na nijhe ni hakika kujha imani ejhu jhitama mugati mwa bhebhe kabhele.
6 Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.
Ejhe ndo sababu nikukhomb'osya kujhingesya karama jha K'yara jhajhijhele mugati mwa bhebhe kwa nj'ela jha kubhekibhwa mabhoko gha nene.
7 Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.
Kwa kujha K'yara atupelili lepi roho jha bhuogha bali jha nghofu ni litengo.
8 Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.
Henu usibhubhoneli agha bhushuhuda kuhusu Bwana bhitu, bhwala bhwa nene Paulo mfungwa ghwa muene. Bali ushirikiajhi malombosi kwandabha jha injili sabhwa ni bhuweza bhwa K'yara.
9 Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. (aiōnios g166)
Ndo K'yara jhaatuokwili ni kutukuta kwa bhwito bhutakatifu. Abhombilepi naha kulengana ni mahengu gha tete bali kulengana ni neema ni mpango bhwa muene. Atupelili mambo agha kwa Kristu Yesu kabla jha nyakati kubhuanja. (aiōnios g166)
10 Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.
Lakini henu bhwokovu bhwa K'yara ufunulibhu kwa kuhida kwa mwokozi ghitu Yesu Kristu. Ndo Kristu jha aghakomisi mauti ni kuleta bhusima bhwabhubeli kukoma kwa nuru jha injili.
11 Nʼihi oziọma a, ahọpụtara m ka m bụrụ onye na-ekwusa oziọma a, na onyeozi, na onye nkuzi.
Kwa ndabha ejhu nachagulibhu kujha muhubiri, mtume ni mwalimu.
12 Ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji na-ahụ ahụhụ ndị a nʼebe a, ma nʼeziokwu, ihere adịghị eme m, nʼihi na amaara m onye m na-atụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe niile m nyere ya nʼaka idebe tutu ruo ụbọchị ahụ.
Kwandabha ejhe niteseka kabhele, lakini nibhonalepi soni kwandabha nimmanyili muene jhanimalikun'kiera. Nijhe ni bhuhakika kujha muene ibhwesya kukitunza khela kyanikikabidhi kwa muene hata ligono lela.
13 Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nʼime Kraịst Jisọs.
Ukombokajhi mfanu bhwa ujumbe bhwa uaminifu bhwauupeliki kuhomela kwa nene, pamonga ni imani ni upendo bhwabhujhele mugati mwa Kristu Yesu.
14 Chezie onyinye ọma ahụ e sitere nʼaka Mmụọ Nsọ bi nʼime gị nye gị idebe.
Ghatunzajhi mambo manofu ghaakukabisi K'yara kup'etela Roho Mtakatifu jhaitama mugati mwa tete.
15 Dị ka i maara, ndị niile si nʼEshịa bịa nʼebe a agbakụtala m azụ. Ọ bụladị Faigelọs na Hamogịnịs ahapụla m laa.
Umanyili kujha bhabhatama Asia bhanilekhili. Mulikundi e'le bhajhele Figelo ni Hemogene.
16 Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.
Bwana airehemuajhi nyumba jha Onesiforo kwa kujha mara nyimehele aniburudisi na ajhibhonili lepi soni minyororo ghya nene.
17 Mgbe ọ bịaruru Rom, ọ chọgharịrị m nʼebe niile, ma nʼikpeazụ, ọ chọtara m.
Badala jhiake, bho ajhe Roma anilondili kwa bidii nesu ni kunikabha.
18 Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.
K'yara an'tangatilayi kukabha rehema kuhoma kwa muene ligono lela. Kama kyaanitangatili bhonijhele Efeso, bhebhe umanyili kinofu.

< 2 Timoti 1 >