< 2 Samuel 7 >

1 O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike,
Gdy król zamieszkał w swoim domu, a PAN dał mu odpoczynek od wszystkich jego wrogów wokoło;
2 ọ sịrị Netan, bụ onye amụma, “Lee, mụ onwe m na-ebi nʼụlọ sida, ma igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼime ụlọ ikwu.”
Król powiedział do proroka Natana: Zobacz, proszę, ja mieszkam w domu cedrowym, a arka Boga mieszka za zasłoną.
3 Netan zaghachiri eze sị, “Ihe ọbụla dị gị nʼobi gaa nʼihu mee ya, nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere gị.”
Wtedy Natan odpowiedział królowi: Idź i uczyń wszystko, co jest w twoim sercu, gdyż PAN jest z tobą.
4 Ma nʼabalị ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Netan ntị, na-asị,
Lecz tej samej nocy doszło do Natana słowo PANA:
5 “Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ gị ga-ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi?
Idź i powiedz mojemu słudze Dawidowi: Tak mówi PAN: Czy ty zbudujesz mi dom, abym w nim mieszkał?
6 Nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta ndị Izrel ruo taa. Kama ana m ejegharị site otu ebe gaa ebe ọzọ, were ụlọ ikwu mere ebe obibi m.
Nie mieszkałem bowiem w żadnym domu od dnia, w którym wyprowadziłem synów Izraela z Egiptu, aż do dziś, lecz wędrowałem w namiocie i w przybytku.
7 Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m Izrel, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?”’
I wszędzie, gdzie wędrowałem ze wszystkimi synami Izraela, czy powiedziałem do któregoś z sędziów Izraela, którym nakazałem paść mój lud Izraela: Dlaczego nie budujecie mi domu cedrowego?
8 “Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị. Mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
Teraz więc tak powiesz mojemu słudze Dawidowi: Tak mówi PAN zastępów: Wziąłem ciebie z owczarni, gdzie chodziłeś za owcami, abyś był wodzem nad moim ludem, nad Izraelem.
9 Anọnyekwara m gị nʼebe ọbụla ị gara, kpochapụ ndị iro gị niile site nʼihu gị. Ugbu a, aga m eme ka aha gị dị ukwuu, dịka aha ndị ikom dịkarịsịrị ukwuu nʼụwa.
I byłem z tobą wszędzie, dokądkolwiek chodziłeś, wytraciłem przed tobą wszystkich twoich wrogów i uczyniłem twoje imię wielkim jak imię wielkich ludzi, którzy są na ziemi.
10 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha; ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,
Ustanowię miejsce dla mojego ludu Izraela i zasadzę go [tam], by mógł mieszkać na swoim miejscu, i nie poruszy się więcej ani już nie będą go uciskać synowie nieprawości jak dawniej;
11 dịka ha na-emekwa siterị na mgbe m họpụtara ndị ndu nye ndị m Izrel. Aga m enyekwa gị ezumike site nʼebe ndị iro gị niile nọ. “‘Onyenwe anyị na-ekwupụtara gị, na Onyenwe anyị ya onwe ya, ga-eguzobere gị ụlọ.
Od czasu, kiedy ustanowiłem sędziów nad moim ludem Izraelem i dałem ci odpoczynek od wszystkich twoich wrogów. Tobie też PAN oznajmia, że zbuduje ci dom.
12 Mgbe ụbọchị gị nʼụwa zuru, mgbe i ga-esoro nna nna gị ha dinaa nʼọnwụ, aga m eme ka otu mkpụrụ gị bilie nọchie ọnọdụ gị, onye bụ anụ ahụ na ọbara gị, aga m emekwa ka alaeze ya guzosie ike.
Gdy się dopełnią twoje dni i zaśniesz ze swoimi ojcami, wzbudzę po tobie twojego potomka, który wyjdzie z twego wnętrza, i umocnię jego królestwo.
13 Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ. Aga m eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
On zbuduje dom dla mojego imienia, a [ja] utwierdzę tron jego królestwa na wieki.
14 Mụ onwe m ga-abụrụ ya nna. Ya onwe ya ga-abụkwara m nwa. Ọ bụrụ na o jehie, aga m eji mkpanaka mmadụ taa ya ahụhụ. Werekwa ihe otiti si nʼaka ndị mmadụ dụọ ya ọdụ.
Ja będę mu ojcem, a on będzie mi synem. Jeśli zgrzeszy, skarcę go rózgą ludzką i razami synów ludzkich.
15 Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị.
Lecz moje miłosierdzie nie odstąpi od niego, tak jak je cofnąłem od Saula, którego odrzuciłem przed tobą.
16 Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’”
I twój dom, i twoje królestwo będą utwierdzone na wieki przed tobą, a twój tron będzie trwał na wieki.
17 Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
Zgodnie z tymi wszystkimi słowami i zgodnie z tym całym widzeniem mówił Natan do Dawida.
18 Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
Wtedy wszedł król Dawid, usiadł przed PANEM i przemówił: Kimże ja [jestem], Panie BOŻE, i czymże jest mój dom, że doprowadziłeś mnie aż dotąd?
19 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu.
Lecz i to było jeszcze mało w twoich oczach, Panie BOŻE, gdyż złożyłeś również obietnicę o domu twojego sługi na daleką przyszłość. Czy taki jest zwyczaj u ludzi, Panie BOŻE?
20 “Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma.
I cóż więcej może powiedzieć ci Dawid? Ty bowiem znasz swojego sługę, Panie BOŻE.
21 Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha.
Ze względu na twoje słowo i zgodnie z twoim sercem uczyniłeś wszystkie te wielkie rzeczy, dając poznać je twemu słudze.
22 “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
Dlatego jesteś wielki, PANIE Boże. Nie ma bowiem nikogo podobnego do ciebie i nie ma Boga oprócz ciebie, zgodnie z tym, co usłyszeliśmy na własne uszy.
23 Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa nke Chineke gara ịgbapụta dịka otu ndị nye onwe ya, na iji mere onwe ya aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
I czyż jest taki naród na ziemi jak twój lud Izrael, dla którego Bóg wyruszył, aby wykupić [go] sobie jako lud, by uczynić [wielkim] swoje imię i dokonać dla nich wielkich i straszliwych rzeczy w twojej ziemi, przed twoim ludem, który wykupiłeś sobie z Egiptu, spośród narodów i ich bogów?
24 I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha.
Ustanowiłeś sobie bowiem swój lud, Izraela, aby był dla ciebie ludem na wieki. A ty, PANIE, stałeś się jego Bogiem.
25 “Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị
Teraz więc, PANIE Boże, utwierdź na wieki słowo, które wypowiedziałeś o swoim słudze i o jego domu, i czyń, jak powiedziałeś;
26 Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị.
Aby twoje imię było wielbione na wieki, aby mówiono: PAN zastępów jest Bogiem nad Izraelem, a dom twego sługi Dawida będzie utwierdzony przed tobą.
27 “O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a.
Ty bowiem, PANIE zastępów, Boże Izraela, objawiłeś swemu słudze, mówiąc: Zbuduję ci dom. Dlatego twój sługa ośmielił się skierować do ciebie tę modlitwę.
28 O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi. I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.
A teraz, Panie BOŻE, ty jesteś tym Bogiem, a twoje słowa są prawdą, obiecałeś swemu słudze tę dobroć.
29 Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”
Teraz więc racz pobłogosławić dom swego sługi, aby przed tobą trwał na wieki. Ty bowiem, Panie BOŻE, to powiedziałeś i dzięki twojemu błogosławieństwu dom twego sługi będzie błogosławiony na wieki.

< 2 Samuel 7 >