< 2 Ndị Kọrint 4 >

1 Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi.
Kwa ele, ndabha tuye ni huduma eye, na kutya katuipokili rehema, tikata lepi tamaa.
2 Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.
Badala yaki, tubelili njela syoa sya soni na sasijifighili. Tuishi lepi kwa hila, na tukalitumila lepi vibaya lilobhi la K'yara. Kwa kulifikisya laliyele la ukueli, tukajilasya tayhoto kwa zamila ya kila munu palongolo pa K'yara.
3 Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi.
Lakini kutya injili ya yhoto ijisighili kwa bhala tu bhabhiangamila.
4 Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. (aiōn g165)
Kup'etela kuchagula kwa bhene, K'yara wa ulimwengu obho abhapofuili uyelebhwa wa bhene wa ubekili kuamini. Matokeo ghaki, bhibhuesya lepi kubhona nulu ya injili ya utukufu wa Kristu, yaayele ndo mfuano wa K'yara. (aiōn g165)
5 Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs.
Kwa ndabha tukakitangasya lepi tayhoto, bali kristu Yesu kutya Bwana, ni tete kabhele kutya bhutumishi bha yhomo kup'etela Yesu.
6 Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
Kwa ndabha muendo ndo aghajobhilo, “muenga alalangasya ku kitita.” Alangese kuhomela mu miteema yhitu, kupisya muanga wa maarifa wa utukufu wa K'yara kup'etela uwepo wa Yesu Kristu.
7 Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị.
Lakini tuye ni hazina ya ele kup'etela fhenu fya undongo, ili ndabha iyelewekai kwa nghofo ibhaa ya K'yara nasoyatete.
8 A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba.
Titaabika kup'etela kila hali, tisongibhwa lepi tibhona mashaka ila tijasi bhwa lepi ni kukata tamaa.
9 A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.
Titesibhwa ila tutetekisibhu hee. Titaghibhwa pasi lakini tiangamisibhwa hee.
10 Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị.
Magono ghoa tip'enda mibhele ya yhoto kifo kya Yesu, yakuwa usima wa Yesu ubhonekanai kabhele mu mibhele ya yhoto.
11 Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
Tete yatuyele hai magono ghoa tupisibhu kufua kwajia ya Yesu, yakuwa uhai wa Yesu ubhonekanai mu mibhele ya yhoto kibinadamu.
12 Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.
Kwa ndabha eye, kifo kibhomba mbhombho mugati mwa yhoto, bali ni usima wibhombha mbhombho mugati mwa yhomo.
13 Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,
Ila tuyele ni roho yelayela ya imani kulengana ni khela ka kiyandikibhu: “Naamini, nikabhele nanenili.” Tete kabhele tiamini, ni kabhele linena.
14 ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya.
Timanyili kabhele yhola ya afufuili Bwana Yesu kabhele alatufufula tete pamonga ni muene. Tumanyili ya kuwa alatuleta tete pamonga ni muenga kup'etela ubhuepo bhuake.
15 Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
Kila khenu ni kwa jia ya yhomo ili ndabha, kadili ya neema kayizidi kuenela kwa bhanu bhingi, shukrani sizidiayi kuyongeseka kwa utukufu wa K'yara.
16 Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Efu tikata lepi tamaa. Japokuwa kwa kwibhala tuyenikichaka, kwa mugati tiketibhua upya magono hadi magono.
17 Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. (aiōnios g166)
Kwa kipindi kifupi eke, mateso agha malaini ghakatuyandala tete kwa jia ya umilele ubhaa wa utukufu wa uzidili fipemu fyoa. (aiōnios g166)
18 Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
Kwa ndabha tilangalepi kwajia ya fhenu fya fibhonekana, bali kwajia ya fhenu fya fibela kubhonekana. Fhenu fafibhuesya kubhonekana ni fya muda tu, bali fhenu fafibela kubhonekana ndo fya milele. (aiōnios g166)

< 2 Ndị Kọrint 4 >