< 2 Ihe E Mere 3 >

1 Mgbe ahụ, Solomọn malitere iwu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼugwu Mọrịa, nke dị na Jerusalem, ka e wukwasịrị ya, nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka Devid bụ nna ya hụ ya anya. Ọ bụ nʼala ebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus, ebe ahụ Devid họpụtara.
Then Solomon began to build the LORD’s house at Jerusalem on Mount Moriah, where the LORD appeared to David his father, which he prepared in the place that David had appointed, on the threshing floor of Ornan the Jebusite.
2 O bidoro iwu ụlọ ahụ nʼabalị nke abụọ, nke ọnwa abụọ, nʼafọ nke anọ, nke ọchịchị eze ya.
He began to build in the second day of the second month, in the fourth year of his reign.
3 Ntọala Solomọn tọrọ maka iwu ụlọnsọ Chineke dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara. (Nke a bụ ma ejiri ihe ọtụtụ ochie).
Now these are the foundations which Solomon laid for the building of God’s house: the length by cubits after the first measure was sixty cubits, and the width twenty cubits.
4 Ịdị ogologo mpụta ọnụ ụlọ nke ụlọnsọ ukwu ahụ dị mita itoolu, dịka ịdị ogologo obosara ụlọ nso ahụ nʼonwe ya. Ịdị elu ya dịkwa mita itoolu. O jikwa ọlaedo a nụchara anụcha machie ime ya.
The porch that was in front, its length, across the width of the house, was twenty cubits, and the height one hundred and twenty; and he overlaid it within with pure gold.
5 O ji osisi junipa machie ahụ ime ụlọ ezumezu ahụ, jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha techie osisi ndị ahụ niile. Emesịa, e sere oyiyi nkwụ dị iche iche, na oyiyi ụdọ igwe nʼahụ ụlọ ahụ iji chọọ ya mma.
He made the larger room with a ceiling of cypress wood, which he overlaid with fine gold, and ornamented it with palm trees and chains.
6 O ji nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche chọọ ime ụlọnsọ ahụ mma, ya na ọlaedo nke e si na Pavaim bute.
He decorated the house with precious stones for beauty. The gold was gold from Parvaim.
7 Ogidi osisi silin niile, na ibo ọnụ ụzọ niile, na aja ụlọ niile, na ọnụ ụzọ niile dị nʼụlọnsọ ukwu ahụ ka o ji ọlaedo techie. Ọ gbukwara egbugbu oyiyi cherubim na mgbidi ya niile.
He also overlaid the house, the beams, the thresholds, its walls, and its doors with gold, and engraved cherubim on the walls.
8 O wuru Ebe ahụ Kachasị Nsọ; nke ogologo ọnụ ụlọ ya dị mita iri, otu a kwa, obosara ya dị mita iri. O ji ọlaedo dị ezi mma nke ọnụahịa ya ruru narị talenti isii techie ahụ ime ụlọ ahụ niile.
He made the most holy place. Its length, according to the width of the house, was twenty cubits, and its width twenty cubits; and he overlaid it with fine gold, amounting to six hundred talents.
9 Ịdị arọ ọlaedo e ji kpụọ ǹtu e ji wuo ya dị iri shekel ise. E jikwa ọlaedo techie akụkụ elu elu nke ime ọnụ ụlọ a.
The weight of the nails was fifty shekels of gold. He overlaid the upper rooms with gold.
10 Solomọn tinyere oyiyi mmụọ ozi cherubim abụọ ọ kpụrụ nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, werekwa ọlaedo machie ha.
In the most holy place he made two cherubim by carving, and they overlaid them with gold.
11 Ịdị ogologo nku cherubim ndị a ruru mita iri. Ịdị ogologo otu nku cherub nke mbụ ruru mita abụọ na ọkara. Ọnụ nku a na-emetụ ahụ ime ụlọ nke ụlọnsọ ukwu, ma ọnụ ọnụ nku nke ọzọ, nke ịdị ogologo ya ruru mita abụọ nʼọkara, na-emetụ ọnụ otu nku cherub nke ọzọ.
The wings of the cherubim were twenty cubits long: the wing of the one was five cubits, reaching to the wall of the house; and the other wing was five cubits, reaching to the wing of the other cherub.
12 Nʼotu aka ahụ, otu nku cherub nke abụọ ruru mita abụọ na ọkara nʼogologo. Ọnụ nku ya na-emetụ akụkụ nke ọzọ nke ahụ ime ụlọnsọ ukwu, ma nku ya nke ọzọ, nke rukwara mita abụọ na ọkara nʼogologo, na-emetụ ọnụ ọnụ otu nku cherub nke mbụ.
The wing of the other cherub was five cubits, reaching to the wall of the house; and the other wing was five cubits, joining to the wing of the other cherub.
13 Nku cherubim ndị a gbasapụrụ ruo mita iri nʼogologo. Ha guzo ọtọ nʼụkwụ ha, na-eche ihu nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ.
The wings of these cherubim spread themselves out twenty cubits. They stood on their feet, and their faces were towards the house.
14 O ji akwa na-acha anụnụ anụnụ, na uhie uhie, na odo odo, na ezi akwa ọcha, mee akwa mgbochi, nke a kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
He made the veil of blue, purple, crimson, and fine linen, and ornamented it with cherubim.
15 O wuru ogidi abụọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nke ịdị elu ya ruru mita iri na asaa. Ọ kpụkwara ihe a dokwasịrị nʼelu ogidi ndị a, nke ịdị elu ha dị mita abụọ na ọkara.
Also he made before the house two pillars thirty-five cubits high, and the capital that was on the top of each of them was five cubits.
16 Ọ kpụkwara ihe yiri ụdọ igwe a tụrụ atụ, nke e kokwasịrị nʼelu ogidi abụọ ndị ahụ. Kpụọkwa narị mkpụrụ pomegranet, nke a ganyekọtara ya na ụdọ igwe ahụ.
He made chains in the inner sanctuary, and put them on the tops of the pillars; and he made one hundred pomegranates, and put them on the chains.
17 O guzobere ogidi abụọ ndị ahụ nʼihu ụlọnsọ ukwu ahụ, otu nʼakụkụ ugwu nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Ogidi nke dị na ndịda ka ọ kpọrọ Jakin, ma nke dị nʼugwu ka ọ kpọrọ Boaz.
He set up the pillars before the temple, one on the right hand and the other on the left; and called the name of that on the right hand Jachin, and the name of that on the left Boaz.

< 2 Ihe E Mere 3 >