< 2 Ihe E Mere 16 >

1 Nʼafọ nke iri atọ na isii nke ọchịchị Asa, Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda. 2 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, zigara Ben-Hadad, eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, 3 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.” 4 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ha lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Maim na obodo niile a na-achịkọbata ihe dị na Naftalị. 5 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, hapụkwa ọrụ ya. 6 Mgbe ahụ, eze Asa chịịrị ndị ikom niile nke Juda. Ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe. O ji ihe ndị a wulie Geba na Mizpa. 7 Nʼoge ahụ Hanani, bụ onye ọhụ ụzọ bịakwutere Asa, bụ eze Juda sị ya, “Ebe ọ bụ na ị hapụrụ Onyenwe anyị Chineke gị, tụkwasị eze Aram obi, lee na usuu ndị agha Siria esitela nʼaka gị wezuga onwe ha. 8 Ndị Kush na ndị Libịa, ha abụghị usuu ndị agha ji ọtụtụ ụgbọ agha, na ndị na-agba ịnyịnya? Ma mgbe ị dabeere na Onyenwe anyị, o nyefere ha nʼaka gị. 9 Nʼihi na anya Onyenwe anyị na-agazu ụwa niile, ịgba ha ume bụ ndị obi ha zuruoke nʼebe ọ nọ. I meela omume nzuzu na nke a, site ugbu a gaa nʼihu ị ga na-enwe agha.” 10 Iwe were Asa megide onye ọhụ ụzọ a nʼihi nke a; iwe were ya nke ukwuu nke mere na ọ tụnyere Hanani nʼụlọ mkpọrọ. Sitekwa nʼoge ahụ, Asa bidoro imekpa ụfọdụ nʼime ndị ya ahụ. 11 Ihe banyere ihe ọzọ niile nʼoge ọchịchị Asa, site na mmalite ruo ọgwụgwụ ka e dere nʼime akwụkwọ ndị eze Juda na Izrel. 12 Nʼime iri afọ atọ na itoolu nke ọchịchị ya, eze Asa rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ. Ọ bụ ezie na ọrịa a siri nọọ ike ma nʼime ọnọdụ ya ọ chọghị enyemaka site nʼaka Onyenwe anyị kama ọ bụ naanị ndị dibịa ka o jekwuru. 13 Asa nwụrụ nʼiri afọ anọ na otu nke ọchịchị eze ya, sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 14 Ha liri ya nʼili nke ọ waara onwe ya nʼobodo Devid. Ha dobere ya nʼelu ihe ịdọba ozu nke jupụtara na ụda dị iche iche, na mmanụ na-esi isi ụtọ nke a gwọkọtara nke ọma, surekwara ya ihe nsure ọkụ nʼebe ọ dị ukwuu iji kwanyere ya ugwu.

< 2 Ihe E Mere 16 >