< 1 Ndị Kọrint 16 >

1 Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu. 2 Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3 Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu. 4 Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro. 5 Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa. 6 Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ. 7 Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye. 8 Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ, 9 nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m. 10 Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya. 11 Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya. 12 Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara. 13 Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike. 14 Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ. 15 Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi. 16 Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị. 17 Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a. 18 Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ. 19 Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị. 20 Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu. 21 Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a. 22 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa! 23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. 24 Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.

< 1 Ndị Kọrint 16 >