< 1 Ndị Kọrint 16 >

1 Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu.
Now concerning the offering for the saints, you also are to do as I directed the church of Galatia.
2 Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara.
On the first day of each week let each of you put aside something, keeping it in store as he may prosper, so that when I come there may be no collections going on.
3 Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
On my arrival I will send those whom you may accredit by letter to carry your bounty to Jerusalem.
4 Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
And if it is worth while for me to go too, they will accompany me.
5 Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa.
Now I shall come to you after I have gone through Macedonia.
6 Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.
I shall remain some time with you; possibly spending the winter, in order that you may help me forward in whatever journey I take.
7 Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye.
For I do not wish at this present time to see you merely in passing; but if the Lord permits, I hope to remain some time with you.
8 Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ,
I am staying for the present in Ephesus, until Pentecost;
9 nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.
for a door has opened to me, great and effectual, and the opponents are many.
10 Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya.
If Timothy come, see to it that he is among you without trepidation; for he is doing the Lord’s work, as I am, so let no one disparage him.
11 Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.
Whenever he comes to me, send him on his way in peace, for I am expecting him with the other brothers.
12 Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
As for our Apollos, I have many times urged him to go to you with the others, but he was always unwilling to go to you at this time. He will come, however, whenever he has a good opportunity.
13 Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
Be watchful, stand firm in the faith, be manly, be strong.
14 Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
Let all that you do be done in love.
15 Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
I beg you this, my brothers - you know the household of Stephanus, that they were the first-fruits of Achaia, and that they devoted themselves to the service of the saints -
16 Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
so I want you also to show deference to such, and to every fellow worker, and laborer.
17 Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
I am glad that Stephanus and Fortunatus and Achaicus have arrived, for they have made up for your absence.
18 Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ.
They refresh my spirit as they do yours. So cultivate the acquaintance of such men.
19 Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
The churches of Asia greet you. Aquila and Priscilla (Prisca), with the church that meets in their house, greet you heartily in the Lord.
20 Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
All the brothers send greetings. Greet one another with a holy kiss.
21 Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a.
The greeting of me, Paul, with my own hand.
22 Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa!
If any one does not love the Lord, let him be accursed. Our Lord is coming.
23 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
The grace of our Lord Jesus be with you.
24 Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.
My love be with you all in Christ Jesus.

< 1 Ndị Kọrint 16 >