< 1 Ihe E Mere 22 >

1 Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”
Then David said, “This is where the house of Yahweh God will be, with the altar for the burnt offerings of Israel.”
2 Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.
So David ordered his servants to gather together the foreigners living in the land of Israel. He assigned them to be stonecutters, to cut stone blocks, in order to build God's house.
3 Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.
David supplied a large amount of iron for the nails for the doors to go in the gateways, and for braces. He also supplied more bronze than could be weighed,
4 O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.
and more cedar trees than could be counted. (The Sidonians and the Tyrians brought too many cedar logs to David to count.)
5 Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.
David said, “My son Solomon is young and inexperienced, and the house that is to be built for Yahweh must be especially magnificent, so that it will be famous and glorious in all other lands. So I will prepare for its building.” So David made extensive preparations before his death.
6 Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.
Then he called for Solomon his son and commanded him to build a house for Yahweh, the God of Israel.
7 Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
David said to Solomon, “My son, it was my intention to build a house myself, for the name of Yahweh my God.
8 ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m.
But Yahweh came to me and said, 'You have shed much blood and have fought many battles. You will not build a house for my name, because you have shed much blood on the earth in my sight.
9 Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.
However, you will have a son who will be a peaceful man. I will give him rest from all his enemies on every side. For his name will be Solomon, and I will give peace and quiet to Israel in his days.
10 Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
He will build a house for my name. He will be my son, and I will be his father. I will establish the throne of his kingdom over Israel forever.'
11 “Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme.
Now, my son, may Yahweh be with you and enable you to succeed. May you build the house of Yahweh your God, as he said you would.
12 Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
Only may Yahweh give you insight and understanding, so that you may obey the law of Yahweh your God, when he places you in charge over Israel.
13 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
Then you will succeed, if you carefully obey the statutes and the decrees that Yahweh gave to Moses concerning Israel. Be strong and courageous. Do not fear or be discouraged.
14 “Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
Now, see, at great effort I have prepared for Yahweh's house 100,000 talents of gold, one million talents of silver, and bronze and iron in large quantities. I have also provided timber and stone. You must add more to all this.
15 Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche,
You have many workmen with you: stonecutters, masons, carpenters, and skillful craftsmen without number of every kind,
16 ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
who can work with gold, silver, bronze, and iron. Arise and begin the work, and may Yahweh be with you.”
17 Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ.
David also ordered all the leaders of Israel to help Solomon his son, saying,
18 Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya.
“Yahweh your God is with you and has given you peace on every side. He has given the region's inhabitants into my hand. The region is subdued before Yahweh and his people.
19 Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso Onyenwe anyị Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha Onyenwe anyị.”
Now seek Yahweh your God with all your heart and your soul. Get up and build the holy place of Yahweh God. Then you can bring the ark of the covenant of Yahweh and the things that belong to God into the house built for Yahweh's name.”

< 1 Ihe E Mere 22 >