< תהילים 8 >

למנצח על הגתית מזמור לדוד יהוה אדנינו מה אדיר שמך בכל הארץ אשר תנה הודך על השמים׃ 1
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
מפי עוללים וינקים יסדת עז למען צורריך להשבית אויב ומתנקם׃ 2
Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
כי אראה שמיך מעשי אצבעתיך ירח וכוכבים אשר כוננתה׃ 3
Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,
מה אנוש כי תזכרנו ובן אדם כי תפקדנו׃ 4
gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
ותחסרהו מעט מאלהים וכבוד והדר תעטרהו׃ 5
I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
תמשילהו במעשי ידיך כל שתה תחת רגליו׃ 6
I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
צנה ואלפים כלם וגם בהמות שדי׃ 7
Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
צפור שמים ודגי הים עבר ארחות ימים׃ 8
na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
יהוה אדנינו מה אדיר שמך בכל הארץ׃ 9
O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.

< תהילים 8 >