< תהילים 73 >

מזמור לאסף אך טוב לישראל אלהים לברי לבב׃ 1
Abụ Ọma Asaf. Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
ואני כמעט נטוי רגלי כאין שפכה אשרי׃ 2
Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
כי קנאתי בהוללים שלום רשעים אראה׃ 3
Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
כי אין חרצבות למותם ובריא אולם׃ 4
Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
בעמל אנוש אינמו ועם אדם לא ינגעו׃ 5
Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
לכן ענקתמו גאוה יעטף שית חמס למו׃ 6
Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
יצא מחלב עינמו עברו משכיות לבב׃ 7
Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
ימיקו וידברו ברע עשק ממרום ידברו׃ 8
Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
שתו בשמים פיהם ולשונם תהלך בארץ׃ 9
Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
לכן ישיב עמו הלם ומי מלא ימצו למו׃ 10
Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
ואמרו איכה ידע אל ויש דעה בעליון׃ 11
Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
הנה אלה רשעים ושלוי עולם השגו חיל׃ 12
Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
אך ריק זכיתי לבבי וארחץ בנקיון כפי׃ 13
Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
ואהי נגוע כל היום ותוכחתי לבקרים׃ 14
Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
אם אמרתי אספרה כמו הנה דור בניך בגדתי׃ 15
Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
ואחשבה לדעת זאת עמל היא בעיני׃ 16
Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
עד אבוא אל מקדשי אל אבינה לאחריתם׃ 17
tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
אך בחלקות תשית למו הפלתם למשואות׃ 18
Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
איך היו לשמה כרגע ספו תמו מן בלהות׃ 19
Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
כחלום מהקיץ אדני בעיר צלמם תבזה׃ 20
Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
כי יתחמץ לבבי וכליותי אשתונן׃ 21
Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
ואני בער ולא אדע בהמות הייתי עמך׃ 22
Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
ואני תמיד עמך אחזת ביד ימיני׃ 23
Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
בעצתך תנחני ואחר כבוד תקחני׃ 24
Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
מי לי בשמים ועמך לא חפצתי בארץ׃ 25
Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
כלה שארי ולבבי צור לבבי וחלקי אלהים לעולם׃ 26
Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
כי הנה רחקיך יאבדו הצמתה כל זונה ממך׃ 27
Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
ואני קרבת אלהים לי טוב שתי באדני יהוה מחסי לספר כל מלאכותיך׃ 28
Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.

< תהילים 73 >