< תהילים 65 >

למנצח מזמור לדוד שיר לך דמיה תהלה אלהים בציון ולך ישלם נדר׃ 1
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
שמע תפלה עדיך כל בשר יבאו׃ 2
O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,
דברי עונת גברו מני פשעינו אתה תכפרם׃ 3
Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
אשרי תבחר ותקרב ישכן חצריך נשבעה בטוב ביתך קדש היכלך׃ 4
Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.
נוראות בצדק תעננו אלהי ישענו מבטח כל קצוי ארץ וים רחקים׃ 5
O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
מכין הרים בכחו נאזר בגבורה׃ 6
onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
משביח שאון ימים שאון גליהם והמון לאמים׃ 7
onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
וייראו ישבי קצות מאותתיך מוצאי בקר וערב תרנין׃ 8
Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
פקדת הארץ ותשקקה רבת תעשרנה פלג אלהים מלא מים תכין דגנם כי כן תכינה׃ 9
Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. Isi iyi Chineke adịghị ata ata, nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
תלמיה רוה נחת גדודיה ברביבים תמגגנה צמחה תברך׃ 10
Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
עטרת שנת טובתך ומעגליך ירעפון דשן׃ 11
Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
ירעפו נאות מדבר וגיל גבעות תחגרנה׃ 12
Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
לבשו כרים הצאן ועמקים יעטפו בר יתרועעו אף ישירו׃ 13
E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.

< תהילים 65 >