< תהילים 63 >

מזמור לדוד בהיותו במדבר יהודה אלהים אלי אתה אשחרך צמאה לך נפשי כמה לך בשרי בארץ ציה ועיף בלי מים׃ 1
Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
כן בקדש חזיתיך לראות עזך וכבודך׃ 2
Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.
כי טוב חסדך מחיים שפתי ישבחונך׃ 3
Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
כן אברכך בחיי בשמך אשא כפי׃ 4
Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
כמו חלב ודשן תשבע נפשי ושפתי רננות יהלל פי׃ 5
Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
אם זכרתיך על יצועי באשמרות אהגה בך׃ 6
Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
כי היית עזרתה לי ובצל כנפיך ארנן׃ 7
Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
דבקה נפשי אחריך בי תמכה ימינך׃ 8
Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.
והמה לשואה יבקשו נפשי יבאו בתחתיות הארץ׃ 9
A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.
יגירהו על ידי חרב מנת שעלים יהיו׃ 10
A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
והמלך ישמח באלהים יתהלל כל הנשבע בו כי יסכר פי דוברי שקר׃ 11
Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

< תהילים 63 >