< תהילים 6 >

למנצח בנגינות על השמינית מזמור לדוד יהוה אל באפך תוכיחני ואל בחמתך תיסרני׃ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid. O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
חנני יהוה כי אמלל אני רפאני יהוה כי נבהלו עצמי׃ 2
Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike. Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
ונפשי נבהלה מאד ואת יהוה עד מתי׃ 3
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?
שובה יהוה חלצה נפשי הושיעני למען חסדך׃ 4
Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
כי אין במות זכרך בשאול מי יודה לך׃ (Sheol h7585) 5
Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? (Sheol h7585)
יגעתי באנחתי אשחה בכל לילה מטתי בדמעתי ערשי אמסה׃ 6
Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
עששה מכעס עיני עתקה בכל צוררי׃ 7
Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
סורו ממני כל פעלי און כי שמע יהוה קול בכיי׃ 8
Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
שמע יהוה תחנתי יהוה תפלתי יקח׃ 9
Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m.
יבשו ויבהלו מאד כל איבי ישבו יבשו רגע׃ 10
Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

< תהילים 6 >