< תהילים 48 >

שיר מזמור לבני קרח גדול יהוה ומהלל מאד בעיר אלהינו הר קדשו׃ 1
Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora. Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto, nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.
יפה נוף משוש כל הארץ הר ציון ירכתי צפון קרית מלך רב׃ 2
Ọ mara mma nʼịdị elu ya, bụkwa ọṅụ elu ụwa niile. Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu, dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.
אלהים בארמנותיה נודע למשגב׃ 3
Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike; o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.
כי הנה המלכים נועדו עברו יחדו׃ 4
Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ, mgbe ha bịakọtara nso,
המה ראו כן תמהו נבהלו נחפזו׃ 5
ihe ha hụrụ juru ha anya; nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.
רעדה אחזתם שם חיל כיולדה׃ 6
Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ, ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.
ברוח קדים תשבר אניות תרשיש׃ 7
Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.
כאשר שמענו כן ראינו בעיר יהוה צבאות בעיר אלהינו אלהים יכוננה עד עולם סלה׃ 8
Dịka anyị nụrụ, otu a ka anyị hụrụ, nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nʼime obodo Chineke anyị: Chineke na-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. (Sela)
דמינו אלהים חסדך בקרב היכלך׃ 9
O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị, ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.
כשמך אלהים כן תהלתך על קצוי ארץ צדק מלאה ימינך׃ 10
O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.
ישמח הר ציון תגלנה בנות יהודה למען משפטיך׃ 11
Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ, obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ nʼihi ikpe gị niile.
סבו ציון והקיפוה ספרו מגדליה׃ 12
Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu, gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.
שיתו לבכם לחילה פסגו ארמנותיה למען תספרו לדור אחרון׃ 13
Lezienụ mgbidi ya niile anya, nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike, ka unu nwee ike ịkọrọ ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.
כי זה אלהים אלהינו עולם ועד הוא ינהגנו על מות׃ 14
Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi, ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.

< תהילים 48 >