< תהילים 40 >

למנצח לדוד מזמור קוה קויתי יהוה ויט אלי וישמע שועתי׃ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.
ויעלני מבור שאון מטיט היון ויקם על סלע רגלי כונן אשרי׃ 2
O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.
ויתן בפי שיר חדש תהלה לאלהינו יראו רבים וייראו ויבטחו ביהוה׃ 3
O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye Chineke anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.
אשרי הגבר אשר שם יהוה מבטחו ולא פנה אל רהבים ושטי כזב׃ 4
Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.
רבות עשית אתה יהוה אלהי נפלאתיך ומחשבתיך אלינו אין ערך אליך אגידה ואדברה עצמו מספר׃ 5
O Onyenwe anyị Chineke m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.
זבח ומנחה לא חפצת אזנים כרית לי עולה וחטאה לא שאלת׃ 6
Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.
אז אמרתי הנה באתי במגלת ספר כתוב עלי׃ 7
Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.
לעשות רצונך אלהי חפצתי ותורתך בתוך מעי׃ 8
O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
בשרתי צדק בקהל רב הנה שפתי לא אכלא יהוה אתה ידעת׃ 9
Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o Onyenwe anyị, anaghị m emechi ọnụ m.
צדקתך לא כסיתי בתוך לבי אמונתך ותשועתך אמרתי לא כחדתי חסדך ואמתך לקהל רב׃ 10
Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.
אתה יהוה לא תכלא רחמיך ממני חסדך ואמתך תמיד יצרוני׃ 11
O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.
כי אפפו עלי רעות עד אין מספר השיגוני עונתי ולא יכלתי לראות עצמו משערות ראשי ולבי עזבני׃ 12
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m.
רצה יהוה להצילני יהוה לעזרתי חושה׃ 13
O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
יבשו ויחפרו יחד מבקשי נפשי לספותה יסגו אחור ויכלמו חפצי רעתי׃ 14
Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.
ישמו על עקב בשתם האמרים לי האח האח׃ 15
Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.
ישישו וישמחו בך כל מבקשיך יאמרו תמיד יגדל יהוה אהבי תשועתך׃ 16
Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
ואני עני ואביון אדני יחשב לי עזרתי ומפלטי אתה אלהי אל תאחר׃ 17
Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka Onyenwe anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.

< תהילים 40 >