< תהילים 27 >

לדוד יהוה אורי וישעי ממי אירא יהוה מעוז חיי ממי אפחד׃ 1
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
בקרב עלי מרעים לאכל את בשרי צרי ואיבי לי המה כשלו ונפלו׃ 2
Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
אם תחנה עלי מחנה לא יירא לבי אם תקום עלי מלחמה בזאת אני בוטח׃ 3
Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
אחת שאלתי מאת יהוה אותה אבקש שבתי בבית יהוה כל ימי חיי לחזות בנעם יהוה ולבקר בהיכלו׃ 4
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
כי יצפנני בסכה ביום רעה יסתרני בסתר אהלו בצור ירוממני׃ 5
Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
ועתה ירום ראשי על איבי סביבותי ואזבחה באהלו זבחי תרועה אשירה ואזמרה ליהוה׃ 6
Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
שמע יהוה קולי אקרא וחנני וענני׃ 7
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
לך אמר לבי בקשו פני את פניך יהוה אבקש׃ 8
Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
אל תסתר פניך ממני אל תט באף עבדך עזרתי היית אל תטשני ואל תעזבני אלהי ישעי׃ 9
Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m.
כי אבי ואמי עזבוני ויהוה יאספני׃ 10
Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.
הורני יהוה דרכך ונחני בארח מישור למען שוררי׃ 11
Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m.
אל תתנני בנפש צרי כי קמו בי עדי שקר ויפח חמס׃ 12
Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
לולא האמנתי לראות בטוב יהוה בארץ חיים׃ 13
Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ.
קוה אל יהוה חזק ויאמץ לבך וקוה אל יהוה׃ 14
Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.

< תהילים 27 >