< תהילים 13 >

למנצח מזמור לדוד עד אנה יהוה תשכחני נצח עד אנה תסתיר את פניך ממני׃ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
עד אנה אשית עצות בנפשי יגון בלבבי יומם עד אנה ירום איבי עלי׃ 2
Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?
הביטה ענני יהוה אלהי האירה עיני פן אישן המות׃ 3
Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
פן יאמר איבי יכלתיו צרי יגילו כי אמוט׃ 4
mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.
ואני בחסדך בטחתי יגל לבי בישועתך׃ 5
Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
אשירה ליהוה כי גמל עלי׃ 6
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.

< תהילים 13 >