< תהילים 104 >

ברכי נפשי את יהוה יהוה אלהי גדלת מאד הוד והדר לבשת׃ 1
Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe.
עטה אור כשלמה נוטה שמים כיריעה׃ 2
Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu
המקרה במים עליותיו השם עבים רכובו המהלך על כנפי רוח׃ 3
na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri. Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
עשה מלאכיו רוחות משרתיו אש להט׃ 4
O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi.
יסד ארץ על מכוניה בל תמוט עולם ועד׃ 5
Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
תהום כלבוש כסיתו על הרים יעמדו מים׃ 6
I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile.
מן גערתך ינוסון מן קול רעמך יחפזון׃ 7
Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.
יעלו הרים ירדו בקעות אל מקום זה יסדת להם׃ 8
Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.
גבול שמת בל יעברון בל ישובון לכסות הארץ׃ 9
Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.
המשלח מעינים בנחלים בין הרים יהלכון׃ 10
Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.
ישקו כל חיתו שדי ישברו פראים צמאם׃ 11
Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ.
עליהם עוף השמים ישכון מבין עפאים יתנו קול׃ 12
Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ.
משקה הרים מעליותיו מפרי מעשיך תשבע הארץ׃ 13
Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya.
מצמיח חציר לבהמה ועשב לעבדת האדם להוציא לחם מן הארץ׃ 14
Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, ime ka nri site nʼala pupụta;
ויין ישמח לבב אנוש להצהיל פנים משמן ולחם לבב אנוש יסעד׃ 15
mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi.
ישבעו עצי יהוה ארזי לבנון אשר נטע׃ 16
A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ.
אשר שם צפרים יקננו חסידה ברושים ביתה׃ 17
Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya.
הרים הגבהים ליעלים סלעים מחסה לשפנים׃ 18
Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha.
עשה ירח למועדים שמש ידע מבואו׃ 19
I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa.
תשת חשך ויהי לילה בו תרמש כל חיתו יער׃ 20
Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị.
הכפירים שאגים לטרף ולבקש מאל אכלם׃ 21
Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha.
תזרח השמש יאספון ואל מעונתם ירבצון׃ 22
Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha.
יצא אדם לפעלו ולעבדתו עדי ערב׃ 23
Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba.
מה רבו מעשיך יהוה כלם בחכמה עשית מלאה הארץ קנינך׃ 24
Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke.
זה הים גדול ורחב ידים שם רמש ואין מספר חיות קטנות עם גדלות׃ 25
Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta.
שם אניות יהלכון לויתן זה יצרת לשחק בו׃ 26
Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu.
כלם אליך ישברון לתת אכלם בעתו׃ 27
Ha niile na-adabere na gị, ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru.
תתן להם ילקטון תפתח ידך ישבעון טוב׃ 28
Ị na-enye ha nri; ha na-erikwa ya. Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, afọ na-eju ha nke ọma.
תסתיר פניך יבהלון תסף רוחם יגועון ואל עפרם ישובון׃ 29
Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, egwu na-eju ha obi. Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta.
תשלח רוחך יבראון ותחדש פני אדמה׃ 30
Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, a na-eke ha; ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa.
יהי כבוד יהוה לעולם ישמח יהוה במעשיו׃ 31
Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ,
המביט לארץ ותרעד יגע בהרים ויעשנו׃ 32
onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ.
אשירה ליהוה בחיי אזמרה לאלהי בעודי׃ 33
Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ.
יערב עליו שיחי אנכי אשמח ביהוה׃ 34
Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
יתמו חטאים מן הארץ ורשעים עוד אינם ברכי נפשי את יהוה הללו יה׃ 35
Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! Toonu Onyenwe anyị!

< תהילים 104 >