< מִשְׁלֵי 27 >

אל תתהלל ביום מחר כי לא תדע מה ילד יום׃ 1
Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ.
יהללך זר ולא פיך נכרי ואל שפתיך׃ 2
Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị.
כבד אבן ונטל החול וכעס אויל כבד משניהם׃ 3
Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ.
אכזריות חמה ושטף אף ומי יעמד לפני קנאה׃ 4
Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe.
טובה תוכחת מגלה מאהבה מסתרת׃ 5
Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
נאמנים פצעי אוהב ונעתרות נשיקות שונא׃ 6
Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
נפש שבעה תבוס נפת ונפש רעבה כל מר מתוק׃ 7
Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
כצפור נודדת מן קנה כן איש נודד ממקומו׃ 8
Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
שמן וקטרת ישמח לב ומתק רעהו מעצת נפש׃ 9
Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.
רעך ורעה אביך אל תעזב ובית אחיך אל תבוא ביום אידך טוב שכן קרוב מאח רחוק׃ 10
Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.
חכם בני ושמח לבי ואשיבה חרפי דבר׃ 11
Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.
ערום ראה רעה נסתר פתאים עברו נענשו׃ 12
Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
קח בגדו כי ערב זר ובעד נכריה חבלהו׃ 13
Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.
מברך רעהו בקול גדול בבקר השכים קללה תחשב לו׃ 14
Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
דלף טורד ביום סגריר ואשת מדונים נשתוה׃ 15
Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
צפניה צפן רוח ושמן ימינו יקרא׃ 16
Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
ברזל בברזל יחד ואיש יחד פני רעהו׃ 17
Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
נצר תאנה יאכל פריה ושמר אדניו יכבד׃ 18
Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
כמים הפנים לפנים כן לב האדם לאדם׃ 19
Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.
שאול ואבדה לא תשבענה ועיני האדם לא תשבענה׃ (Sheol h7585) 20
Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. (Sheol h7585)
מצרף לכסף וכור לזהב ואיש לפי מהללו׃ 21
Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha.
אם תכתוש את האויל במכתש בתוך הריפות בעלי לא תסור מעליו אולתו׃ 22
Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha.
ידע תדע פני צאנך שית לבך לעדרים׃ 23
Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ,
כי לא לעולם חסן ואם נזר לדור דור׃ 24
nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.
גלה חציר ונראה דשא ונאספו עשבות הרים׃ 25
Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu.
כבשים ללבושך ומחיר שדה עתודים׃ 26
Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị.
ודי חלב עזים ללחמך ללחם ביתך וחיים לנערותיך׃ 27
Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.

< מִשְׁלֵי 27 >