< מִשְׁלֵי 20 >

לץ היין המה שכר וכל שגה בו לא יחכם׃ 1
Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
נהם ככפיר אימת מלך מתעברו חוטא נפשו׃ 2
Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
כבוד לאיש שבת מריב וכל אויל יתגלע׃ 3
Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
מחרף עצל לא יחרש ישאל בקציר ואין׃ 4
Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
מים עמקים עצה בלב איש ואיש תבונה ידלנה׃ 5
Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
רב אדם יקרא איש חסדו ואיש אמונים מי ימצא׃ 6
Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
מתהלך בתמו צדיק אשרי בניו אחריו׃ 7
Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
מלך יושב על כסא דין מזרה בעיניו כל רע׃ 8
Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
מי יאמר זכיתי לבי טהרתי מחטאתי׃ 9
Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
אבן ואבן איפה ואיפה תועבת יהוה גם שניהם׃ 10
Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
גם במעלליו יתנכר נער אם זך ואם ישר פעלו׃ 11
Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
אזן שמעת ועין ראה יהוה עשה גם שניהם׃ 12
Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
אל תאהב שנה פן תורש פקח עיניך שבע לחם׃ 13
Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
רע רע יאמר הקונה ואזל לו אז יתהלל׃ 14
“Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
יש זהב ורב פנינים וכלי יקר שפתי דעת׃ 15
Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
לקח בגדו כי ערב זר ובעד נכרים חבלהו׃ 16
Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
ערב לאיש לחם שקר ואחר ימלא פיהו חצץ׃ 17
Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
מחשבות בעצה תכון ובתחבלות עשה מלחמה׃ 18
Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
גולה סוד הולך רכיל ולפתה שפתיו לא תתערב׃ 19
Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
מקלל אביו ואמו ידעך נרו באישון חשך׃ 20
Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
נחלה מבחלת בראשנה ואחריתה לא תברך׃ 21
Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
אל תאמר אשלמה רע קוה ליהוה וישע לך׃ 22
A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
תועבת יהוה אבן ואבן ומאזני מרמה לא טוב׃ 23
Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
מיהוה מצעדי גבר ואדם מה יבין דרכו׃ 24
Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
מוקש אדם ילע קדש ואחר נדרים לבקר׃ 25
Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
מזרה רשעים מלך חכם וישב עליהם אופן׃ 26
Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
נר יהוה נשמת אדם חפש כל חדרי בטן׃ 27
Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
חסד ואמת יצרו מלך וסעד בחסד כסאו׃ 28
Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
תפארת בחורים כחם והדר זקנים שיבה׃ 29
Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
חברות פצע תמריק ברע ומכות חדרי בטן׃ 30
Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.

< מִשְׁלֵי 20 >