< במדבר 34 >

וידבר יהוה אל משה לאמר׃ 1
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
צו את בני ישראל ואמרת אלהם כי אתם באים אל הארץ כנען זאת הארץ אשר תפל לכם בנחלה ארץ כנען לגבלתיה׃ 2
“Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
והיה לכם פאת נגב ממדבר צן על ידי אדום והיה לכם גבול נגב מקצה ים המלח קדמה׃ 3
“‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,
ונסב לכם הגבול מנגב למעלה עקרבים ועבר צנה והיה תוצאתיו מנגב לקדש ברנע ויצא חצר אדר ועבר עצמנה׃ 4
gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,
ונסב הגבול מעצמון נחלה מצרים והיו תוצאתיו הימה׃ 5
ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
וגבול ים והיה לכם הים הגדול וגבול זה יהיה לכם גבול ים׃ 6
Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
וזה יהיה לכם גבול צפון מן הים הגדל תתאו לכם הר ההר׃ 7
Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor.
מהר ההר תתאו לבא חמת והיו תוצאת הגבל צדדה׃ 8
Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad,
ויצא הגבל זפרנה והיו תוצאתיו חצר עינן זה יהיה לכם גבול צפון׃ 9
ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
והתאויתם לכם לגבול קדמה מחצר עינן שפמה׃ 10
Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam.
וירד הגבל משפם הרבלה מקדם לעין וירד הגבול ומחה על כתף ים כנרת קדמה׃ 11
Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili.
וירד הגבול הירדנה והיו תוצאתיו ים המלח זאת תהיה לכם הארץ לגבלתיה סביב׃ 12
Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu. “‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’”
ויצו משה את בני ישראל לאמר זאת הארץ אשר תתנחלו אתה בגורל אשר צוה יהוה לתת לתשעת המטות וחצי המטה׃ 13
Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza. Onyenwe anyị enyela iwu ka enye ya ebo itoolu na ọkara ndị ahụ fọdụrụ.
כי לקחו מטה בני הראובני לבית אבתם ומטה בני הגדי לבית אבתם וחצי מטה מנשה לקחו נחלתם׃ 14
Nʼihi na ebo Ruben na Gad tinyere ọkara ebo Manase, enwetalarị ala ihe nketa ha.
שני המטות וחצי המטה לקחו נחלתם מעבר לירדן ירחו קדמה מזרחה׃ 15
Ebo abụọ nʼọkara ndị a enwetala ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu obodo Jeriko.”
וידבר יהוה אל משה לאמר׃ 16
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
אלה שמות האנשים אשר ינחלו לכם את הארץ אלעזר הכהן ויהושע בן נון׃ 17
“Ndị a bụ aha ndị ikom m họpụtara ịhụ na e kenyere unu ala ahụ dịka ihe nketa unu. Elieza onye nchụaja, na Joshua nwa Nun.
ונשיא אחד נשיא אחד ממטה תקחו לנחל את הארץ׃ 18
Site nʼebo ọbụla họpụta otu onyendu ka ha nye aka ikesa ala nketa ahụ.
ואלה שמות האנשים למטה יהודה כלב בן יפנה׃ 19
“Ndị a bụ aha ndị a họpụtara: “Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
ולמטה בני שמעון שמואל בן עמיהוד׃ 20
Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
למטה בנימן אלידד בן כסלון׃ 21
Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
ולמטה בני דן נשיא בקי בן יגלי׃ 22
Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
לבני יוסף למטה בני מנשה נשיא חניאל בן אפד׃ 23
Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
ולמטה בני אפרים נשיא קמואל בן שפטן׃ 24
Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
ולמטה בני זבולן נשיא אליצפן בן פרנך׃ 25
Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
ולמטה בני יששכר נשיא פלטיאל בן עזן׃ 26
Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
ולמטה בני אשר נשיא אחיהוד בן שלמי׃ 27
Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
ולמטה בני נפתלי נשיא פדהאל בן עמיהוד׃ 28
Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
אלה אשר צוה יהוה לנחל את בני ישראל בארץ כנען׃ 29
Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.

< במדבר 34 >