< מיכה 6 >

שמעו נא את אשר יהוה אמר קום ריב את ההרים ותשמענה הגבעות קולך׃ 1
Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.
שמעו הרים את ריב יהוה והאתנים מסדי ארץ כי ריב ליהוה עם עמו ועם ישראל יתוכח׃ 2
“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka.
עמי מה עשיתי לך ומה הלאתיך ענה בי׃ 3
“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.
כי העלתיך מארץ מצרים ומבית עבדים פדיתיך ואשלח לפניך את משה אהרן ומרים׃ 4
Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka.
עמי זכר נא מה יעץ בלק מלך מואב ומה ענה אתו בלעם בן בעור מן השטים עד הגלגל למען דעת צדקות יהוה׃ 5
Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
במה אקדם יהוה אכף לאלהי מרום האקדמנו בעולות בעגלים בני שנה׃ 6
Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?
הירצה יהוה באלפי אילים ברבבות נחלי שמן האתן בכורי פשעי פרי בטני חטאת נפשי׃ 7
Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
הגיד לך אדם מה טוב ומה יהוה דורש ממך כי אם עשות משפט ואהבת חסד והצנע לכת עם אלהיך׃ 8
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
קול יהוה לעיר יקרא ותושיה יראה שמך שמעו מטה ומי יעדה׃ 9
Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
עוד האש בית רשע אצרות רשע ואיפת רזון זעומה׃ 10
Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
האזכה במאזני רשע ובכיס אבני מרמה׃ 11
M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
אשר עשיריה מלאו חמס וישביה דברו שקר ולשונם רמיה בפיהם׃ 12
Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.
וגם אני החליתי הכותך השמם על חטאתך׃ 13
Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu
אתה תאכל ולא תשבע וישחך בקרבך ותסג ולא תפליט ואשר תפלט לחרב אתן׃ 14
Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.
אתה תזרע ולא תקצור אתה תדרך זית ולא תסוך שמן ותירוש ולא תשתה יין׃ 15
Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi, unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu; unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya.
וישתמר חקות עמרי וכל מעשה בית אחאב ותלכו במעצותם למען תתי אתך לשמה וישביה לשרקה וחרפת עמי תשאו׃ 16
Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”

< מיכה 6 >