< איכה 5 >

זכר יהוה מה היה לנו הביט וראה את חרפתנו׃ 1
Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
נחלתנו נהפכה לזרים בתינו לנכרים׃ 2
E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
יתומים היינו אין אב אמתינו כאלמנות׃ 3
Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
מימינו בכסף שתינו עצינו במחיר יבאו׃ 4
Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
על צוארנו נרדפנו יגענו לא הונח לנו׃ 5
Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
מצרים נתנו יד אשור לשבע לחם׃ 6
Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
אבתינו חטאו אינם אנחנו עונתיהם סבלנו׃ 7
Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
עבדים משלו בנו פרק אין מידם׃ 8
Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
בנפשנו נביא לחמנו מפני חרב המדבר׃ 9
Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
עורנו כתנור נכמרו מפני זלעפות רעב׃ 10
Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
נשים בציון ענו בתלת בערי יהודה׃ 11
Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
שרים בידם נתלו פני זקנים לא נהדרו׃ 12
Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
בחורים טחון נשאו ונערים בעץ כשלו׃ 13
Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
זקנים משער שבתו בחורים מנגינתם׃ 14
Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
שבת משוש לבנו נהפך לאבל מחלנו׃ 15
Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
נפלה עטרת ראשנו אוי נא לנו כי חטאנו׃ 16
Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
על זה היה דוה לבנו על אלה חשכו עינינו׃ 17
Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
על הר ציון ששמם שועלים הלכו בו׃ 18
Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
אתה יהוה לעולם תשב כסאך לדר ודור׃ 19
Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
למה לנצח תשכחנו תעזבנו לארך ימים׃ 20
Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
השיבנו יהוה אליך ונשוב חדש ימינו כקדם׃ 21
Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
כי אם מאס מאסתנו קצפת עלינו עד מאד׃ 22
ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam na-eweso anyị iwe nke ukwu.

< איכה 5 >