< שופטים 8 >

ויאמרו אליו איש אפרים מה הדבר הזה עשית לנו לבלתי קראות לנו כי הלכת להלחם במדין ויריבון אתו בחזקה׃ 1
Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.
ויאמר אליהם מה עשיתי עתה ככם הלוא טוב עללות אפרים מבציר אביעזר׃ 2
Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?
בידכם נתן אלהים את שרי מדין את ערב ואת זאב ומה יכלתי עשות ככם אז רפתה רוחם מעליו בדברו הדבר הזה׃ 3
Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.
ויבא גדעון הירדנה עבר הוא ושלש מאות האיש אשר אתו עיפים ורדפים׃ 4
Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.
ויאמר לאנשי סכות תנו נא ככרות לחם לעם אשר ברגלי כי עיפים הם ואנכי רדף אחרי זבח וצלמנע מלכי מדין׃ 5
Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.”
ויאמר שרי סכות הכף זבח וצלמנע עתה בידך כי נתן לצבאך לחם׃ 6
Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?”
ויאמר גדעון לכן בתת יהוה את זבח ואת צלמנע בידי ודשתי את בשרכם את קוצי המדבר ואת הברקנים׃ 7
Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe Onyenwe anyị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.”
ויעל משם פנואל וידבר אליהם כזאת ויענו אותו אנשי פנואל כאשר ענו אנשי סכות׃ 8
O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara.
ויאמר גם לאנשי פנואל לאמר בשובי בשלום אתץ את המגדל הזה׃ 9
Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.”
וזבח וצלמנע בקרקר ומחניהם עמם כחמשת עשר אלף כל הנותרים מכל מחנה בני קדם והנפלים מאה ועשרים אלף איש שלף חרב׃ 10
Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.
ויעל גדעון דרך השכוני באהלים מקדם לנבח ויגבהה ויך את המחנה והמחנה היה בטח׃ 11
Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.
וינוסו זבח וצלמנע וירדף אחריהם וילכד את שני מלכי מדין את זבח ואת צלמנע וכל המחנה החריד׃ 12
Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile.
וישב גדעון בן יואש מן המלחמה מלמעלה החרס׃ 13
Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.
וילכד נער מאנשי סכות וישאלהו ויכתב אליו את שרי סכות ואת זקניה שבעים ושבעה איש׃ 14
Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.
ויבא אל אנשי סכות ויאמר הנה זבח וצלמנע אשר חרפתם אותי לאמר הכף זבח וצלמנע עתה בידך כי נתן לאנשיך היעפים לחם׃ 15
Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’”
ויקח את זקני העיר ואת קוצי המדבר ואת הברקנים וידע בהם את אנשי סכות׃ 16
O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.
ואת מגדל פנואל נתץ ויהרג את אנשי העיר׃ 17
Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.
ויאמר אל זבח ואל צלמנע איפה האנשים אשר הרגתם בתבור ויאמרו כמוך כמוהם אחד כתאר בני המלך׃ 18
Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”
ויאמר אחי בני אמי הם חי יהוה לו החיתם אותם לא הרגתי אתכם׃ 19
Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.”
ויאמר ליתר בכורו קום הרג אותם ולא שלף הנער חרבו כי ירא כי עודנו נער׃ 20
O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
ויאמר זבח וצלמנע קום אתה ופגע בנו כי כאיש גבורתו ויקם גדעון ויהרג את זבח ואת צלמנע ויקח את השהרנים אשר בצוארי גמליהם׃ 21
Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
ויאמרו איש ישראל אל גדעון משל בנו גם אתה גם בנך גם בן בנך כי הושעתנו מיד מדין׃ 22
Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.”
ויאמר אלהם גדעון לא אמשל אני בכם ולא ימשל בני בכם יהוה ימשל בכם׃ 23
Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”
ויאמר אלהם גדעון אשאלה מכם שאלה ותנו לי איש נזם שללו כי נזמי זהב להם כי ישמעאלים הם׃ 24
Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.)
ויאמרו נתון נתן ויפרשו את השמלה וישליכו שמה איש נזם שללו׃ 25
Ha jiri obi ụtọ kwenye, gbasaa akwa nʼala, tinyechaa ọlantị ha nʼime ya. Onye ọbụla nʼime ha mere nke a.
ויהי משקל נזמי הזהב אשר שאל אלף ושבע מאות זהב לבד מן השהרנים והנטפות ובגדי הארגמן שעל מלכי מדין ולבד מן הענקות אשר בצוארי גמליהם׃ 26
Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha.
ויעש אותו גדעון לאפוד ויצג אותו בעירו בעפרה ויזנו כל ישראל אחריו שם ויהי לגדעון ולביתו למוקש׃ 27
Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya.
ויכנע מדין לפני בני ישראל ולא יספו לשאת ראשם ותשקט הארץ ארבעים שנה בימי גדעון׃ 28
Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
וילך ירבעל בן יואש וישב בביתו׃ 29
Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
ולגדעון היו שבעים בנים יצאי ירכו כי נשים רבות היו לו׃ 30
Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
ופילגשו אשר בשכם ילדה לו גם היא בן וישם את שמו אבימלך׃ 31
O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.
וימת גדעון בן יואש בשיבה טובה ויקבר בקבר יואש אביו בעפרה אבי העזרי׃ 32
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza.
ויהי כאשר מת גדעון וישובו בני ישראל ויזנו אחרי הבעלים וישימו להם בעל ברית לאלהים׃ 33
Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.
ולא זכרו בני ישראל את יהוה אלהיהם המציל אותם מיד כל איביהם מסביב׃ 34
Ma ụmụ Izrel echetaghị Onyenwe anyị Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.
ולא עשו חסד עם בית ירבעל גדעון ככל הטובה אשר עשה עם ישראל׃ 35
Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.

< שופטים 8 >