< יהושע 9 >

ויהי כשמע כל המלכים אשר בעבר הירדן בהר ובשפלה ובכל חוף הים הגדול אל מול הלבנון החתי והאמרי הכנעני הפרזי החוי והיבוסי׃ 1
Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus,
ויתקבצו יחדו להלחם עם יהושע ועם ישראל פה אחד׃ 2
ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel.
וישבי גבעון שמעו את אשר עשה יהושע ליריחו ולעי׃ 3
Ma mgbe ndị Gibiọn nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai,
ויעשו גם המה בערמה וילכו ויצטירו ויקחו שקים בלים לחמוריהם ונאדות יין בלים ומבקעים ומצררים׃ 4
ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha.
ונעלות בלות ומטלאות ברגליהם ושלמות בלות עליהם וכל לחם צידם יבש היה נקדים׃ 5
Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.
וילכו אל יהושע אל המחנה הגלגל ויאמרו אליו ואל איש ישראל מארץ רחוקה באנו ועתה כרתו לנו ברית׃ 6
Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”
ויאמרו איש ישראל אל החוי אולי בקרבי אתה יושב ואיך אכרות לך ברית׃ 7
Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?”
ויאמרו אל יהושע עבדיך אנחנו ויאמר אלהם יהושע מי אתם ומאין תבאו׃ 8
Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.” Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”
ויאמרו אליו מארץ רחוקה מאד באו עבדיך לשם יהוה אלהיך כי שמענו שמעו ואת כל אשר עשה במצרים׃ 9
Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere Onyenwe anyị Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt.
ואת כל אשר עשה לשני מלכי האמרי אשר בעבר הירדן לסיחון מלך חשבון ולעוג מלך הבשן אשר בעשתרות׃ 10
Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt.
ויאמרו אלינו זקינינו וכל ישבי ארצנו לאמר קחו בידכם צידה לדרך ולכו לקראתם ואמרתם אליהם עבדיכם אנחנו ועתה כרתו לנו ברית׃ 11
Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.”’
זה לחמנו חם הצטידנו אתו מבתינו ביום צאתנו ללכת אליכם ועתה הנה יבש והיה נקדים׃ 12
Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu.
ואלה נאדות היין אשר מלאנו חדשים והנה התבקעו ואלה שלמותינו ונעלינו בלו מרב הדרך מאד׃ 13
A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”
ויקחו האנשים מצידם ואת פי יהוה לא שאלו׃ 14
Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị.
ויעש להם יהושע שלום ויכרת להם ברית לחיותם וישבעו להם נשיאי העדה׃ 15
Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.
ויהי מקצה שלשת ימים אחרי אשר כרתו להם ברית וישמעו כי קרבים הם אליו ובקרבו הם ישבים׃ 16
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso.
ויסעו בני ישראל ויבאו אל עריהם ביום השלישי ועריהם גבעון והכפירה ובארות וקרית יערים׃ 17
Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim.
ולא הכום בני ישראל כי נשבעו להם נשיאי העדה ביהוה אלהי ישראל וילנו כל העדה על הנשיאים׃ 18
Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ. Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a.
ויאמרו כל הנשיאים אל כל העדה אנחנו נשבענו להם ביהוה אלהי ישראל ועתה לא נוכל לנגע בהם׃ 19
Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla.
זאת נעשה להם והחיה אותם ולא יהיה עלינו קצף על השבועה אשר נשבענו להם׃ 20
Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”
ויאמרו אליהם הנשיאים יחיו ויהיו חטבי עצים ושאבי מים לכל העדה כאשר דברו להם הנשיאים׃ 21
Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.
ויקרא להם יהושע וידבר אליהם לאמר למה רמיתם אתנו לאמר רחוקים אנחנו מכם מאד ואתם בקרבנו ישבים׃ 22
Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso?
ועתה ארורים אתם ולא יכרת מכם עבד וחטבי עצים ושאבי מים לבית אלהי׃ 23
Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.”
ויענו את יהושע ויאמרו כי הגד הגד לעבדיך את אשר צוה יהוה אלהיך את משה עבדו לתת לכם את כל הארץ ולהשמיד את כל ישבי הארץ מפניכם ונירא מאד לנפשתינו מפניכם ונעשה את הדבר הזה׃ 24
Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na Onyenwe anyị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị.
ועתה הננו בידך כטוב וכישר בעיניך לעשות לנו עשה׃ 25
Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.”
ויעש להם כן ויצל אותם מיד בני ישראל ולא הרגום׃ 26
Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha.
ויתנם יהושע ביום ההוא חטבי עצים ושאבי מים לעדה ולמזבח יהוה עד היום הזה אל המקום אשר יבחר׃ 27
Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.

< יהושע 9 >