< יהושע 16 >

ויצא הגורל לבני יוסף מירדן יריחו למי יריחו מזרחה המדבר עלה מיריחו בהר בית אל׃ 1
Ala e kenyere ụmụ ụmụ Josef bidoro nʼosimiri Jọdan nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jeriko gbatịrị ruo nʼọzara. O sitere na Jeriko gbagoo ala ugwu ugwu ahụ, ruokwa Betel.
ויצא מבית אל לוזה ועבר אל גבול הארכי עטרות׃ 2
O sitekwara Betel (ya bụ Luz), gafee ruo Atarọt, ebe ndị Akai bi.
וירד ימה אל גבול היפלטי עד גבול בית חורן תחתון ועד גזר והיו תצאתו ימה׃ 3
Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ rute ala ndị Jaflet, ruo ala mgbada mgbada Bet-Horon. O si nʼebe ahụ ruo Gaza, tutu kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
וינחלו בני יוסף מנשה ואפרים׃ 4
Ụmụ Josef bụ Ifrem, na Manase nwetara ihe nketa ha.
ויהי גבול בני אפרים למשפחתם ויהי גבול נחלתם מזרחה עטרות אדר עד בית חורן עליון׃ 5
Ndị a bụ ala nke ikwu dị iche iche dị nʼebo Ifrem nwetara. Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ malitere nʼAtarọt-Ada. Site nʼebe ahụ, o ruru nʼakụkụ elu elu Bet-Horon;
ויצא הגבול הימה המכמתת מצפון ונסב הגבול מזרחה תאנת שלה ועבר אותו ממזרח ינוחה׃ 6
sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼosimiri Mediterenịa. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu malitere na Mikmetat, gafee nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Taanat Shaịlo, gafee ya ruo na Janoa.
וירד מינוחה עטרות ונערתה ופגע ביריחו ויצא הירדן׃ 7
O sitere na Janoa gbadaa ruo Atarọt, na Naara, bịaruo Jeriko, gafee, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
מתפוח ילך הגבול ימה נחל קנה והיו תצאתיו הימה זאת נחלת מטה בני אפרים למשפחתם׃ 8
Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị.
והערים המבדלות לבני אפרים בתוך נחלת בני מנשה כל הערים וחצריהן׃ 9
E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.
ולא הורישו את הכנעני היושב בגזר וישב הכנעני בקרב אפרים עד היום הזה ויהי למס עבד׃ 10
Ma ha achụpụghị ndị Kenan ndị bi na Gaza. Nʼihi nke a, ndị Kenan binyere ndị Ifrem ruo taa, ma e mere ka ha bụrụ ndị ọrụ ngo.

< יהושע 16 >