< יהושע 12 >

ואלה מלכי הארץ אשר הכו בני ישראל וירשו את ארצם בעבר הירדן מזרחה השמש מנחל ארנון עד הר חרמון וכל הערבה מזרחה׃ 1
Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba.
סיחון מלך האמרי היושב בחשבון משל מערוער אשר על שפת נחל ארנון ותוך הנחל וחצי הגלעד ועד יבק הנחל גבול בני עמון׃ 2
Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya.
והערבה עד ים כנרות מזרחה ועד ים הערבה ים המלח מזרחה דרך בית הישמות ומתימן תחת אשדות הפסגה׃ 3
Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga.
וגבול עוג מלך הבשן מיתר הרפאים היושב בעשתרות ובאדרעי׃ 4
Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei.
ומשל בהר חרמון ובסלכה ובכל הבשן עד גבול הגשורי והמעכתי וחצי הגלעד גבול סיחון מלך חשבון׃ 5
Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn.
משה עבד יהוה ובני ישראל הכום ויתנה משה עבד יהוה ירשה לראובני ולגדי ולחצי שבט המנשה׃ 6
Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.
ואלה מלכי הארץ אשר הכה יהושע ובני ישראל בעבר הירדן ימה מבעל גד בבקעת הלבנון ועד ההר החלק העלה שעירה ויתנה יהושע לשבטי ישראל ירשה כמחלקתם׃ 7
Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.
בהר ובשפלה ובערבה ובאשדות ובמדבר ובנגב החתי האמרי והכנעני הפרזי החוי והיבוסי׃ 8
Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ndị a bụ ndị eze ahụ:
מלך יריחו אחד מלך העי אשר מצד בית אל אחד׃ 9
Eze Jeriko, otu eze Ai (nke dị nso na Betel), otu
מלך ירושלם אחד מלך חברון אחד׃ 10
eze Jerusalem, otu eze Hebrọn, otu
מלך ירמות אחד מלך לכיש אחד׃ 11
Eze Jamut, otu eze Lakish, otu
מלך עגלון אחד מלך גזר אחד׃ 12
eze Eglọn, otu eze Gaza, otu
מלך דבר אחד מלך גדר אחד׃ 13
eze Debịa, otu eze Geda, otu
מלך חרמה אחד מלך ערד אחד׃ 14
eze Homa, otu eze Arad, otu
מלך לבנה אחד מלך עדלם אחד׃ 15
eze Libna, otu eze Adulam, otu
מלך מקדה אחד מלך בית אל אחד׃ 16
eze Makeda, otu eze Betel, otu
מלך תפוח אחד מלך חפר אחד׃ 17
eze Tapụọa, otu eze Hefa, otu
מלך אפק אחד מלך לשרון אחד׃ 18
eze Afek, otu eze Lasharọn, otu
מלך מדון אחד מלך חצור אחד׃ 19
eze Madọn, otu eze Hazọ, otu
מלך שמרון מראון אחד מלך אכשף אחד׃ 20
eze Shịmrọn Meron, otu eze Akshaf, otu
מלך תענך אחד מלך מגדו אחד׃ 21
eze Teanak, otu eze Megido, otu
מלך קדש אחד מלך יקנעם לכרמל אחד׃ 22
eze Kedesh, otu eze Jokneam, nʼime Kamel, otu
מלך דור לנפת דור אחד מלך גוים לגלגל אחד׃ 23
eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu eze Goiim, nʼime Gilgal, otu na
מלך תרצה אחד כל מלכים שלשים ואחד׃ 24
eze Tịaza, otu. Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu.

< יהושע 12 >