< איוב 41 >

תמשך לויתן בחכה ובחבל תשקיע לשנו׃ 1
“Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
התשים אגמון באפו ובחוח תקוב לחיו׃ 2
Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
הירבה אליך תחנונים אם ידבר אליך רכות׃ 3
Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
היכרת ברית עמך תקחנו לעבד עולם׃ 4
Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
התשחק בו כצפור ותקשרנו לנערותיך׃ 5
Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
יכרו עליו חברים יחצוהו בין כנענים׃ 6
Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
התמלא בשכות עורו ובצלצל דגים ראשו׃ 7
Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
שים עליו כפך זכר מלחמה אל תוסף׃ 8
Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
הן תחלתו נכזבה הגם אל מראיו יטל׃ 9
Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
לא אכזר כי יעורנו ומי הוא לפני יתיצב׃ 10
Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
מי הקדימני ואשלם תחת כל השמים לי הוא׃ 11
Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
לא אחריש בדיו ודבר גבורות וחין ערכו׃ 12
“Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
מי גלה פני לבושו בכפל רסנו מי יבוא׃ 13
Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
דלתי פניו מי פתח סביבות שניו אימה׃ 14
Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
גאוה אפיקי מגנים סגור חותם צר׃ 15
Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
אחד באחד יגשו ורוח לא יבוא ביניהם׃ 16
nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
איש באחיהו ידבקו יתלכדו ולא יתפרדו׃ 17
E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
עטישתיו תהל אור ועיניו כעפעפי שחר׃ 18
Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
מפיו לפידים יהלכו כידודי אש יתמלטו׃ 19
Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
מנחיריו יצא עשן כדוד נפוח ואגמן׃ 20
Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
נפשו גחלים תלהט ולהב מפיו יצא׃ 21
Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
בצוארו ילין עז ולפניו תדוץ דאבה׃ 22
Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
מפלי בשרו דבקו יצוק עליו בל ימוט׃ 23
Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
לבו יצוק כמו אבן ויצוק כפלח תחתית׃ 24
Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
משתו יגורו אלים משברים יתחטאו׃ 25
Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
משיגהו חרב בלי תקום חנית מסע ושריה׃ 26
O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
יחשב לתבן ברזל לעץ רקבון נחושה׃ 27
Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
לא יבריחנו בן קשת לקש נהפכו לו אבני קלע׃ 28
Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
כקש נחשבו תותח וישחק לרעש כידון׃ 29
Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
תחתיו חדודי חרש ירפד חרוץ עלי טיט׃ 30
Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
ירתיח כסיר מצולה ים ישים כמרקחה׃ 31
Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
אחריו יאיר נתיב יחשב תהום לשיבה׃ 32
Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
אין על עפר משלו העשו לבלי חת׃ 33
O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
את כל גבה יראה הוא מלך על כל בני שחץ׃ 34
Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”

< איוב 41 >