< איוב 26 >

ויען איוב ויאמר׃ 1
Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
מה עזרת ללא כח הושעת זרוע לא עז׃ 2
“Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
מה יעצת ללא חכמה ותושיה לרב הודעת׃ 3
Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
את מי הגדת מלין ונשמת מי יצאה ממך׃ 4
Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
הרפאים יחוללו מתחת מים ושכניהם׃ 5
“Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
ערום שאול נגדו ואין כסות לאבדון׃ (Sheol h7585) 6
Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol h7585)
נטה צפון על תהו תלה ארץ על בלי מה׃ 7
Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
צרר מים בעביו ולא נבקע ענן תחתם׃ 8
Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
מאחז פני כסה פרשז עליו עננו׃ 9
Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
חק חג על פני מים עד תכלית אור עם חשך׃ 10
O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
עמודי שמים ירופפו ויתמהו מגערתו׃ 11
Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
בכחו רגע הים ובתובנתו מחץ רהב׃ 12
Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
ברוחו שמים שפרה חללה ידו נחש בריח׃ 13
Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
הן אלה קצות דרכו ומה שמץ דבר נשמע בו ורעם גבורתו מי יתבונן׃ 14
Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”

< איוב 26 >