< ירמיה 25 >

הדבר אשר היה על ירמיהו על כל עם יהודה בשנה הרבעית ליהויקים בן יאשיהו מלך יהודה היא השנה הראשנית לנבוכדראצר מלך בבל׃ 1
Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn.
אשר דבר ירמיהו הנביא על כל עם יהודה ואל כל ישבי ירושלם לאמר׃ 2
Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:
מן שלש עשרה שנה ליאשיהו בן אמון מלך יהודה ועד היום הזה זה שלש ועשרים שנה היה דבר יהוה אלי ואדבר אליכם אשכים ודבר ולא שמעתם׃ 3
Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu.
ושלח יהוה אליכם את כל עבדיו הנבאים השכם ושלח ולא שמעתם ולא הטיתם את אזנכם לשמע׃ 4
Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.
לאמר שובו נא איש מדרכו הרעה ומרע מעלליכם ושבו על האדמה אשר נתן יהוה לכם ולאבותיכם למן עולם ועד עולם׃ 5
Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a Onyenwe anyị nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi.
ואל תלכו אחרי אלהים אחרים לעבדם ולהשתחות להם ולא תכעיסו אותי במעשה ידיכם ולא ארע לכם׃ 6
Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ.
ולא שמעתם אלי נאם יהוה למען הכעסוני במעשה ידיכם לרע לכם׃ 7
“Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”
לכן כה אמר יהוה צבאות יען אשר לא שמעתם את דברי׃ 8
Ya mere, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m.
הנני שלח ולקחתי את כל משפחות צפון נאם יהוה ואל נבוכדראצר מלך בבל עבדי והבאתים על הארץ הזאת ועל ישביה ועל כל הגוים האלה סביב והחרמתים ושמתים לשמה ולשרקה ולחרבות עולם׃ 9
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
והאבדתי מהם קול ששון וקול שמחה קול חתן וקול כלה קול רחים ואור נר׃ 10
Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.
והיתה כל הארץ הזאת לחרבה לשמה ועבדו הגוים האלה את מלך בבל שבעים שנה׃ 11
Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa.
והיה כמלאות שבעים שנה אפקד על מלך בבל ועל הגוי ההוא נאם יהוה את עונם ועל ארץ כשדים ושמתי אתו לשממות עולם׃ 12
“Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
והבאיתי על הארץ ההיא את כל דברי אשר דברתי עליה את כל הכתוב בספר הזה אשר נבא ירמיהו על כל הגוים׃ 13
Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.
כי עבדו בם גם המה גוים רבים ומלכים גדולים ושלמתי להם כפעלם וכמעשה ידיהם׃ 14
A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.”
כי כה אמר יהוה אלהי ישראל אלי קח את כוס היין החמה הזאת מידי והשקיתה אתו את כל הגוים אשר אנכי שלח אותך אליהם׃ 15
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya.
ושתו והתגעשו והתהללו מפני החרב אשר אנכי שלח בינתם׃ 16
Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”
ואקח את הכוס מיד יהוה ואשקה את כל הגוים אשר שלחני יהוה אליהם׃ 17
Ya mere, esi m nʼaka Onyenwe anyị nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya.
את ירושלם ואת ערי יהודה ואת מלכיה את שריה לתת אתם לחרבה לשמה לשרקה ולקללה כיום הזה׃ 18
Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa.
את פרעה מלך מצרים ואת עבדיו ואת שריו ואת כל עמו׃ 19
Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile,
ואת כל הערב ואת כל מלכי ארץ העוץ ואת כל מלכי ארץ פלשתים ואת אשקלון ואת עזה ואת עקרון ואת שארית אשדוד׃ 20
na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ; na ndị eze Uz; na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd.
את אדום ואת מואב ואת בני עמון׃ 21
Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn;
ואת כל מלכי צר ואת כל מלכי צידון ואת מלכי האי אשר בעבר הים׃ 22
na ndị eze Taịa na Saịdọn, na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ;
ואת דדן ואת תימא ואת בוז ואת כל קצוצי פאה׃ 23
na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya.
ואת כל מלכי ערב ואת כל מלכי הערב השכנים במדבר׃ 24
Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara;
ואת כל מלכי זמרי ואת כל מלכי עילם ואת כל מלכי מדי׃ 25
na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia;
ואת כל מלכי הצפון הקרבים והרחקים איש אל אחיו ואת כל הממלכות הארץ אשר על פני האדמה ומלך ששך ישתה אחריהם׃ 26
na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa. Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ.
ואמרת אליהם כה אמר יהוה צבאות אלהי ישראל שתו ושכרו וקיו ונפלו ולא תקומו מפני החרב אשר אנכי שלח ביניכם׃ 27
“Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’
והיה כי ימאנו לקחת הכוס מידך לשתות ואמרת אליהם כה אמר יהוה צבאות שתו תשתו׃ 28
Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
כי הנה בעיר אשר נקרא שמי עליה אנכי מחל להרע ואתם הנקה תנקו לא תנקו כי חרב אני קרא על כל ישבי הארץ נאם יהוה צבאות׃ 29
Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
ואתה תנבא אליהם את כל הדברים האלה ואמרת אליהם יהוה ממרום ישאג וממעון קדשו יתן קולו שאג ישאג על נוהו הידד כדרכים יענה אל כל ישבי הארץ׃ 30
“Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha, “‘Onyenwe anyị ga-esi nʼelu bigbọọ; ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda. Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala ya Ọ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị; ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa.
בא שאון עד קצה הארץ כי ריב ליהוה בגוים נשפט הוא לכל בשר הרשעים נתנם לחרב נאם יהוה׃ 31
Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo. Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile, meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
כה אמר יהוה צבאות הנה רעה יצאת מגוי אל גוי וסער גדול יעור מירכתי ארץ׃ 32
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”
והיו חללי יהוה ביום ההוא מקצה הארץ ועד קצה הארץ לא יספדו ולא יאספו ולא יקברו לדמן על פני האדמה יהיו׃ 33
Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.
הילילו הרעים וזעקו והתפלשו אדירי הצאן כי מלאו ימיכם לטבוח ותפוצותיכם ונפלתם ככלי חמדה׃ 34
Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa; tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ. Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola, unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja.
ואבד מנוס מן הרעים ופליטה מאדירי הצאן׃ 35
Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.
קול צעקת הרעים ויללת אדירי הצאן כי שדד יהוה את מרעיתם׃ 36
Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ, geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-ebibi ebe ịta nri ha.
ונדמו נאות השלום מפני חרון אף יהוה׃ 37
Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi oke iwe nke Onyenwe anyị.
עזב ככפיר סכו כי היתה ארצם לשמה מפני חרון היונה ומפני חרון אפו׃ 38
Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa. Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, nʼihi mma agha nke onye mmegbu, na nʼihi oke iwe Onyenwe anyị.

< ירמיה 25 >