< ירמיה 20 >

וישמע פשחור בן אמר הכהן והוא פקיד נגיד בבית יהוה את ירמיהו נבא את הדברים האלה׃ 1
Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu,
ויכה פשחור את ירמיהו הנביא ויתן אתו על המהפכת אשר בשער בנימן העליון אשר בבית יהוה׃ 2
o nyere iwu ka e tie Jeremaya, bụ onye amụma ihe, kee ya agbụ, tinye ya nʼọnụ ụzọ ama Dị Elu nke Benjamin, nke dị ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
ויהי ממחרת ויצא פשחור את ירמיהו מן המהפכת ויאמר אליו ירמיהו לא פשחור קרא יהוה שמך כי אם מגור מסביב׃ 3
Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu.
כי כה אמר יהוה הנני נתנך למגור לך ולכל אהביך ונפלו בחרב איביהם ועיניך ראות ואת כל יהודה אתן ביד מלך בבל והגלם בבלה והכם בחרב׃ 4
Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.
ונתתי את כל חסן העיר הזאת ואת כל יגיעה ואת כל יקרה ואת כל אוצרות מלכי יהודה אתן ביד איביהם ובזזום ולקחום והביאום בבלה׃ 5
Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn.
ואתה פשחור וכל ישבי ביתך תלכו בשבי ובבל תבוא ושם תמות ושם תקבר אתה וכל אהביך אשר נבאת להם בשקר׃ 6
Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’”
פתיתני יהוה ואפת חזקתני ותוכל הייתי לשחוק כל היום כלה לעג לי׃ 7
Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.
כי מדי אדבר אזעק חמס ושד אקרא כי היה דבר יהוה לי לחרפה ולקלס כל היום׃ 8
Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.
ואמרתי לא אזכרנו ולא אדבר עוד בשמו והיה בלבי כאש בערת עצר בעצמתי ונלאיתי כלכל ולא אוכל׃ 9
Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya.
כי שמעתי דבת רבים מגור מסביב הגידו ונגידנו כל אנוש שלומי שמרי צלעי אולי יפתה ונוכלה לו ונקחה נקמתנו ממנו׃ 10
Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”
ויהוה אותי כגבור עריץ על כן רדפי יכשלו ולא יכלו בשו מאד כי לא השכילו כלמת עולם לא תשכח׃ 11
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.
ויהוה צבאות בחן צדיק ראה כליות ולב אראה נקמתך מהם כי אליך גליתי את ריבי׃ 12
Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.
שירו ליהוה הללו את יהוה כי הציל את נפש אביון מיד מרעים׃ 13
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ! Nyenụ Onyenwe anyị otuto! Nʼihi na ọ na-anapụta ndụ ndị mkpa na-akpa, site nʼaka ndị ajọ omume.
ארור היום אשר ילדתי בו יום אשר ילדתני אמי אל יהי ברוך׃ 14
Ihe a bụrụ ọnụ ka ụbọchị ahụ a mụrụ m bụ. Ka ụbọchị nne m mụrụ m ghara inwe ngọzị.
ארור האיש אשר בשר את אבי לאמר ילד לך בן זכר שמח שמחהו׃ 15
Onye a na-abụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ nke wetara nna m akụkọ ọmụmụ m, nke mere ka ọ ṅụrịa ọṅụ, na-asị ya, “A mụọlara gị nwa, ọ bụ nwa nwoke!”
והיה האיש ההוא כערים אשר הפך יהוה ולא נחם ושמע זעקה בבקר ותרועה בעת צהרים׃ 16
Ka e meekwa nwoke ahụ ihe Onyenwe anyị mere obodo ndị ahụ o bibiri na-enweghị ọmịiko. Ka nwoke ahụ nọgidekwa na-anụ iti mkpu akwa nʼụtụtụ, na akwa ibu agha nʼehihie.
אשר לא מותתני מרחם ותהי לי אמי קברי ורחמה הרת עולם׃ 17
Nʼihi na ọ hapụrụ igbu m mgbe m nọ nʼafọ nne m, hapụ ime ka afọ nne m bụrụ ili m, ka afọ ya bụrụkwa ihe buru ibu ruo mgbe ebighị ebi.
למה זה מרחם יצאתי לראות עמל ויגון ויכלו בבשת ימי׃ 18
Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?

< ירמיה 20 >