< ישעה 14 >

כי ירחם יהוה את יעקב ובחר עוד בישראל והניחם על אדמתם ונלוה הגר עליהם ונספחו על בית יעקב׃ 1
Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
ולקחום עמים והביאום אל מקומם והתנחלום בית ישראל על אדמת יהוה לעבדים ולשפחות והיו שבים לשביהם ורדו בנגשיהם׃ 2
Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
והיה ביום הניח יהוה לך מעצבך ומרגזך ומן העבדה הקשה אשר עבד בך׃ 3
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
ונשאת המשל הזה על מלך בבל ואמרת איך שבת נגש שבתה מדהבה׃ 4
unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
שבר יהוה מטה רשעים שבט משלים׃ 5
Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
מכה עמים בעברה מכת בלתי סרה רדה באף גוים מרדף בלי חשך׃ 6
nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
נחה שקטה כל הארץ פצחו רנה׃ 7
Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ.
גם ברושים שמחו לך ארזי לבנון מאז שכבת לא יעלה הכרת עלינו׃ 8
Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
שאול מתחת רגזה לך לקראת בואך עורר לך רפאים כל עתודי ארץ הקים מכסאותם כל מלכי גוים׃ (Sheol h7585) 9
Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. (Sheol h7585)
כלם יענו ויאמרו אליך גם אתה חלית כמונו אלינו נמשלת׃ 10
Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
הורד שאול גאונך המית נבליך תחתיך יצע רמה ומכסיך תולעה׃ (Sheol h7585) 11
Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. (Sheol h7585)
איך נפלת משמים הילל בן שחר נגדעת לארץ חולש על גוים׃ 12
Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
ואתה אמרת בלבבך השמים אעלה ממעל לכוכבי אל ארים כסאי ואשב בהר מועד בירכתי צפון׃ 13
Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
אעלה על במתי עב אדמה לעליון׃ 14
Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
אך אל שאול תורד אל ירכתי בור׃ (Sheol h7585) 15
Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
ראיך אליך ישגיחו אליך יתבוננו הזה האיש מרגיז הארץ מרעיש ממלכות׃ 16
Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
שם תבל כמדבר ועריו הרס אסיריו לא פתח ביתה׃ 17
Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
כל מלכי גוים כלם שכבו בכבוד איש בביתו׃ 18
Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
ואתה השלכת מקברך כנצר נתעב לבוש הרגים מטעני חרב יורדי אל אבני בור כפגר מובס׃ 19
Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
לא תחד אתם בקבורה כי ארצך שחת עמך הרגת לא יקרא לעולם זרע מרעים׃ 20
A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
הכינו לבניו מטבח בעון אבותם בל יקמו וירשו ארץ ומלאו פני תבל ערים׃ 21
Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
וקמתי עליהם נאם יהוה צבאות והכרתי לבבל שם ושאר ונין ונכד נאם יהוה׃ 22
Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
ושמתיה למורש קפד ואגמי מים וטאטאתיה במטאטא השמד נאם יהוה צבאות׃ 23
Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
נשבע יהוה צבאות לאמר אם לא כאשר דמיתי כן היתה וכאשר יעצתי היא תקום׃ 24
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
לשבר אשור בארצי ועל הרי אבוסנו וסר מעליהם עלו וסבלו מעל שכמו יסור׃ 25
M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
זאת העצה היעוצה על כל הארץ וזאת היד הנטויה על כל הגוים׃ 26
Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
כי יהוה צבאות יעץ ומי יפר וידו הנטויה ומי ישיבנה׃ 27
Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
בשנת מות המלך אחז היה המשא הזה׃ 28
Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
אל תשמחי פלשת כלך כי נשבר שבט מכך כי משרש נחש יצא צפע ופריו שרף מעופף׃ 29
Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
ורעו בכורי דלים ואביונים לבטח ירבצו והמתי ברעב שרשך ושאריתך יהרג׃ 30
Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.
הילילי שער זעקי עיר נמוג פלשת כלך כי מצפון עשן בא ואין בודד במועדיו׃ 31
Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo! Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia. Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị. Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha.
ומה יענה מלאכי גוי כי יהוה יסד ציון ובה יחסו עניי עמו׃ 32
Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye ndị ozi si na mba ahụ? Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike. Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.

< ישעה 14 >