< חבקוק 1 >

המשא אשר חזה חבקוק הנביא׃ 1
Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.
עד אנה יהוה שועתי ולא תשמע אזעק אליך חמס ולא תושיע׃ 2
Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta?
למה תראני און ועמל תביט ושד וחמס לנגדי ויהי ריב ומדון ישא׃ 3
Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.
על כן תפוג תורה ולא יצא לנצח משפט כי רשע מכתיר את הצדיק על כן יצא משפט מעקל׃ 4
Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.
ראו בגוים והביטו והתמהו תמהו כי פעל פעל בימיכם לא תאמינו כי יספר׃ 5
“Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
כי הנני מקים את הכשדים הגוי המר והנמהר ההולך למרחבי ארץ לרשת משכנות לא לו׃ 6
Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
אים ונורא הוא ממנו משפטו ושאתו יצא׃ 7
Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu. Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme. Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
וקלו מנמרים סוסיו וחדו מזאבי ערב ופשו פרשיו ופרשיו מרחוק יבאו יעפו כנשר חש לאכול׃ 8
Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
כלה לחמס יבוא מגמת פניהם קדימה ויאסף כחול שבי׃ 9
Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
והוא במלכים יתקלס ורזנים משחק לו הוא לכל מבצר ישחק ויצבר עפר וילכדה׃ 10
Ha na-akwa ndị eze emo, jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị. Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị, na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.
אז חלף רוח ויעבר ואשם זו כחו לאלהו׃ 11
Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
הלוא אתה מקדם יהוה אלהי קדשי לא נמות יהוה למשפט שמתו וצור להוכיח יסדתו׃ 12
Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
טהור עינים מראות רע והביט אל עמל לא תוכל למה תביט בוגדים תחריש בבלע רשע צדיק ממנו׃ 13
Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
ותעשה אדם כדגי הים כרמש לא משל בו׃ 14
I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
כלה בחכה העלה יגרהו בחרמו ויאספהו במכמרתו על כן ישמח ויגיל׃ 15
Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
על כן יזבח לחרמו ויקטר למכמרתו כי בהמה שמן חלקו ומאכלו בראה׃ 16
Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma
העל כן יריק חרמו ותמיד להרג גוים לא יחמול׃ 17
Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?

< חבקוק 1 >