< שמות 4 >

ויען משה ויאמר והן לא יאמינו לי ולא ישמעו בקלי כי יאמרו לא נראה אליך יהוה׃ 1
Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘Onyenwe anyị egosighị gị onwe ya.’”
ויאמר אליו יהוה מזה בידך ויאמר מטה׃ 2
Ma Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.”
ויאמר השליכהו ארצה וישליכהו ארצה ויהי לנחש וינס משה מפניו׃ 3
Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ.
ויאמר יהוה אל משה שלח ידך ואחז בזנבו וישלח ידו ויחזק בו ויהי למטה בכפו׃ 4
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka.
למען יאמינו כי נראה אליך יהוה אלהי אבתם אלהי אברהם אלהי יצחק ואלהי יעקב׃ 5
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.”
ויאמר יהוה לו עוד הבא נא ידך בחיקך ויבא ידו בחיקו ויוצאה והנה ידו מצרעת כשלג׃ 6
Onyenwe anyị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha.
ויאמר השב ידך אל חיקך וישב ידו אל חיקו ויוצאה מחיקו והנה שבה כבשרו׃ 7
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ.
והיה אם לא יאמינו לך ולא ישמעו לקל האת הראשון והאמינו לקל האת האחרון׃ 8
Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a.
והיה אם לא יאמינו גם לשני האתות האלה ולא ישמעון לקלך ולקחת ממימי היאר ושפכת היבשה והיו המים אשר תקח מן היאר והיו לדם ביבשת׃ 9
Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”
ויאמר משה אל יהוה בי אדני לא איש דברים אנכי גם מתמול גם משלשם גם מאז דברך אל עבדך כי כבד פה וכבד לשון אנכי׃ 10
Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”
ויאמר יהוה אליו מי שם פה לאדם או מי ישום אלם או חרש או פקח או עור הלא אנכי יהוה׃ 11
Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị?
ועתה לך ואנכי אהיה עם פיך והוריתיך אשר תדבר׃ 12
Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”
ויאמר בי אדני שלח נא ביד תשלח׃ 13
Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.”
ויחר אף יהוה במשה ויאמר הלא אהרן אחיך הלוי ידעתי כי דבר ידבר הוא וגם הנה הוא יצא לקראתך וראך ושמח בלבו׃ 14
Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.
ודברת אליו ושמת את הדברים בפיו ואנכי אהיה עם פיך ועם פיהו והוריתי אתכם את אשר תעשון׃ 15
Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.
ודבר הוא לך אל העם והיה הוא יהיה לך לפה ואתה תהיה לו לאלהים׃ 16
Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.
ואת המטה הזה תקח בידך אשר תעשה בו את האתת׃ 17
Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”
וילך משה וישב אל יתר חתנו ויאמר לו אלכה נא ואשובה אל אחי אשר במצרים ואראה העודם חיים ויאמר יתרו למשה לך לשלום׃ 18
Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.”
ויאמר יהוה אל משה במדין לך שב מצרים כי מתו כל האנשים המבקשים את נפשך׃ 19
Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.”
ויקח משה את אשתו ואת בניו וירכבם על החמר וישב ארצה מצרים ויקח משה את מטה האלהים בידו׃ 20
Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya.
ויאמר יהוה אל משה בלכתך לשוב מצרימה ראה כל המפתים אשר שמתי בידך ועשיתם לפני פרעה ואני אחזק את לבו ולא ישלח את העם׃ 21
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.
ואמרת אל פרעה כה אמר יהוה בני בכרי ישראל׃ 22
Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.
ואמר אליך שלח את בני ויעבדני ותמאן לשלחו הנה אנכי הרג את בנך בכרך׃ 23
Agwara m gị okwu sị, “Hapụ nwa m nwoke ka o si nʼala Ijipt pụọ gaa ebe ọ ga-anọ fee m ofufe,” ma ị jụrụ ajụ. Ugbu a aga m egbu ọkpara gị.’”
ויהי בדרך במלון ויפגשהו יהוה ויבקש המיתו׃ 24
Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya.
ותקח צפרה צר ותכרת את ערלת בנה ותגע לרגליו ותאמר כי חתן דמים אתה לי׃ 25
Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.”
וירף ממנו אז אמרה חתן דמים למולת׃ 26
Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)
ויאמר יהוה אל אהרן לך לקראת משה המדברה וילך ויפגשהו בהר האלהים וישק לו׃ 27
Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ.
ויגד משה לאהרן את כל דברי יהוה אשר שלחו ואת כל האתת אשר צוהו׃ 28
Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee.
וילך משה ואהרן ויאספו את כל זקני בני ישראל׃ 29
Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile.
וידבר אהרן את כל הדברים אשר דבר יהוה אל משה ויעש האתת לעיני העם׃ 30
Erọn gwara ha ihe niile Onyenwe anyị gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha.
ויאמן העם וישמעו כי פקד יהוה את בני ישראל וכי ראה את ענים ויקדו וישתחוו׃ 31
Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na Onyenwe anyị eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.

< שמות 4 >