< דברים 28 >

והיה אם שמוע תשמע בקול יהוה אלהיך לשמר לעשות את כל מצותיו אשר אנכי מצוך היום ונתנך יהוה אלהיך עליון על כל גויי הארץ׃ 1
Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu.
ובאו עליך כל הברכות האלה והשיגך כי תשמע בקול יהוה אלהיך׃ 2
Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere Onyenwe anyị Chineke gị isi.
ברוך אתה בעיר וברוך אתה בשדה׃ 3
Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi.
ברוך פרי בטנך ופרי אדמתך ופרי בהמתך שגר אלפיך ועשתרות צאנך׃ 4
Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị.
ברוך טנאך ומשארתך׃ 5
Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ.
ברוך אתה בבאך וברוך אתה בצאתך׃ 6
Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ.
יתן יהוה את איביך הקמים עליך נגפים לפניך בדרך אחד יצאו אליך ובשבעה דרכים ינוסו לפניך׃ 7
Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga.
יצו יהוה אתך את הברכה באסמיך ובכל משלח ידך וברכך בארץ אשר יהוה אלהיך נתן לך׃ 8
Onyenwe anyị ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị.
יקימך יהוה לו לעם קדוש כאשר נשבע לך כי תשמר את מצות יהוה אלהיך והלכת בדרכיו׃ 9
Onyenwe anyị ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile.
וראו כל עמי הארץ כי שם יהוה נקרא עליך ויראו ממך׃ 10
Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha Onyenwe anyị ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu.
והותרך יהוה לטובה בפרי בטנך ובפרי בהמתך ובפרי אדמתך על האדמה אשר נשבע יהוה לאבתיך לתת לך׃ 11
Onyenwe anyị ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị.
יפתח יהוה לך את אוצרו הטוב את השמים לתת מטר ארצך בעתו ולברך את כל מעשה ידך והלוית גוים רבים ואתה לא תלוה׃ 12
Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.
ונתנך יהוה לראש ולא לזנב והיית רק למעלה ולא תהיה למטה כי תשמע אל מצות יהוה אלהיך אשר אנכי מצוך היום לשמר ולעשות׃ 13
Onyenwe anyị ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru.
ולא תסור מכל הדברים אשר אנכי מצוה אתכם היום ימין ושמאול ללכת אחרי אלהים אחרים לעבדם׃ 14
Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe.
והיה אם לא תשמע בקול יהוה אלהיך לשמר לעשות את כל מצותיו וחקתיו אשר אנכי מצוך היום ובאו עליך כל הקללות האלה והשיגוך׃ 15
Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị.
ארור אתה בעיר וארור אתה בשדה׃ 16
Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi,
ארור טנאך ומשארתך׃ 17
Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
ארור פרי בטנך ופרי אדמתך שגר אלפיך ועשתרות צאנך׃ 18
Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.
ארור אתה בבאך וארור אתה בצאתך׃ 19
Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
ישלח יהוה בך את המארה את המהומה ואת המגערת בכל משלח ידך אשר תעשה עד השמדך ועד אבדך מהר מפני רע מעלליך אשר עזבתני׃ 20
Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m.
ידבק יהוה בך את הדבר עד כלתו אתך מעל האדמה אשר אתה בא שמה לרשתה׃ 21
Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.
יככה יהוה בשחפת ובקדחת ובדלקת ובחרחר ובחרב ובשדפון ובירקון ורדפוך עד אבדך׃ 22
Onyenwe anyị ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi.
והיו שמיך אשר על ראשך נחשת והארץ אשר תחתיך ברזל׃ 23
Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.
יתן יהוה את מטר ארצך אבק ועפר מן השמים ירד עליך עד השמדך׃ 24
Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.
יתנך יהוה נגף לפני איביך בדרך אחד תצא אליו ובשבעה דרכים תנוס לפניו והיית לזעוה לכל ממלכות הארץ׃ 25
Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.
והיתה נבלתך למאכל לכל עוף השמים ולבהמת הארץ ואין מחריד׃ 26
Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
יככה יהוה בשחין מצרים ובעפלים ובגרב ובחרס אשר לא תוכל להרפא׃ 27
Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.
יככה יהוה בשגעון ובעורון ובתמהון לבב׃ 28
Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi.
והיית ממשש בצהרים כאשר ימשש העור באפלה ולא תצליח את דרכיך והיית אך עשוק וגזול כל הימים ואין מושיע׃ 29
Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị.
אשה תארש ואיש אחר ישגלנה בית תבנה ולא תשב בו כרם תטע ולא תחללנו׃ 30
Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya.
שורך טבוח לעיניך ולא תאכל ממנו חמרך גזול מלפניך ולא ישוב לך צאנך נתנות לאיביך ואין לך מושיע׃ 31
Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha.
בניך ובנתיך נתנים לעם אחר ועיניך ראות וכלות אליהם כל היום ואין לאל ידך׃ 32
A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.
פרי אדמתך וכל יגיעך יאכל עם אשר לא ידעת והיית רק עשוק ורצוץ כל הימים׃ 33
Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile.
והיית משגע ממראה עיניך אשר תראה׃ 34
Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.
יככה יהוה בשחין רע על הברכים ועל השקים אשר לא תוכל להרפא מכף רגלך ועד קדקדך׃ 35
Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.
יולך יהוה אתך ואת מלכך אשר תקים עליך אל גוי אשר לא ידעת אתה ואבתיך ועבדת שם אלהים אחרים עץ ואבן׃ 36
Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.
והיית לשמה למשל ולשנינה בכל העמים אשר ינהגך יהוה שמה׃ 37
Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị.
זרע רב תוציא השדה ומעט תאסף כי יחסלנו הארבה׃ 38
Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.
כרמים תטע ועבדת ויין לא תשתה ולא תאגר כי תאכלנו התלעת׃ 39
Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.
זיתים יהיו לך בכל גבולך ושמן לא תסוך כי ישל זיתך׃ 40
Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.
בנים ובנות תוליד ולא יהיו לך כי ילכו בשבי׃ 41
Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.
כל עצך ופרי אדמתך יירש הצלצל׃ 42
Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị.
הגר אשר בקרבך יעלה עליך מעלה מעלה ואתה תרד מטה מטה׃ 43
Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ.
הוא ילוך ואתה לא תלונו הוא יהיה לראש ואתה תהיה לזנב׃ 44
Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.
ובאו עליך כל הקללות האלה ורדפוך והשיגוך עד השמדך כי לא שמעת בקול יהוה אלהיך לשמר מצותיו וחקתיו אשר צוך׃ 45
Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị.
והיו בך לאות ולמופת ובזרעך עד עולם׃ 46
Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.
תחת אשר לא עבדת את יהוה אלהיך בשמחה ובטוב לבב מרב כל׃ 47
Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.
ועבדת את איביך אשר ישלחנו יהוה בך ברעב ובצמא ובעירם ובחסר כל ונתן על ברזל על צוארך עד השמידו אתך׃ 48
Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.
ישא יהוה עליך גוי מרחוק מקצה הארץ כאשר ידאה הנשר גוי אשר לא תשמע לשנו׃ 49
Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha,
גוי עז פנים אשר לא ישא פנים לזקן ונער לא יחן׃ 50
Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.
ואכל פרי בהמתך ופרי אדמתך עד השמדך אשר לא ישאיר לך דגן תירוש ויצהר שגר אלפיך ועשתרת צאנך עד האבידו אתך׃ 51
Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi.
והצר לך בכל שעריך עד רדת חמתיך הגבהות והבצרות אשר אתה בטח בהן בכל ארצך והצר לך בכל שעריך בכל ארצך אשר נתן יהוה אלהיך לך׃ 52
Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
ואכלת פרי בטנך בשר בניך ובנתיך אשר נתן לך יהוה אלהיך במצור ובמצוק אשר יציק לך איבך׃ 53
Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro.
האיש הרך בך והענג מאד תרע עינו באחיו ובאשת חיקו וביתר בניו אשר יותיר׃ 54
Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ.
מתת לאחד מהם מבשר בניו אשר יאכל מבלי השאיר לו כל במצור ובמצוק אשר יציק לך איבך בכל שעריך׃ 55
Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere.
הרכה בך והענגה אשר לא נסתה כף רגלה הצג על הארץ מהתענג ומרך תרע עינה באיש חיקה ובבנה ובבתה׃ 56
Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị,
ובשליתה היוצת מבין רגליה ובבניה אשר תלד כי תאכלם בחסר כל בסתר במצור ובמצוק אשר יציק לך איבך בשעריך׃ 57
ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.
אם לא תשמר לעשות את כל דברי התורה הזאת הכתובים בספר הזה ליראה את השם הנכבד והנורא הזה את יהוה אלהיך׃ 58
Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
והפלא יהוה את מכתך ואת מכות זרעך מכות גדלות ונאמנות וחלים רעים ונאמנים׃ 59
Onyenwe anyị ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala.
והשיב בך את כל מדוה מצרים אשר יגרת מפניהם ודבקו בך׃ 60
Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ.
גם כל חלי וכל מכה אשר לא כתוב בספר התורה הזאת יעלם יהוה עליך עד השמדך׃ 61
Ọ bụghị naanị nke a! Onyenwe anyị ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị.
ונשארתם במתי מעט תחת אשר הייתם ככוכבי השמים לרב כי לא שמעת בקול יהוה אלהיך׃ 62
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu Onyenwe anyị bụ Chineke gị.
והיה כאשר שש יהוה עליכם להיטיב אתכם ולהרבות אתכם כן ישיש יהוה עליכם להאביד אתכם ולהשמיד אתכם ונסחתם מעל האדמה אשר אתה בא שמה לרשתה׃ 63
Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị.
והפיצך יהוה בכל העמים מקצה הארץ ועד קצה הארץ ועבדת שם אלהים אחרים אשר לא ידעת אתה ואבתיך עץ ואבן׃ 64
Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ.
ובגוים ההם לא תרגיע ולא יהיה מנוח לכף רגלך ונתן יהוה לך שם לב רגז וכליון עינים ודאבון נפש׃ 65
Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba.
והיו חייך תלאים לך מנגד ופחדת לילה ויומם ולא תאמין בחייך׃ 66
Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka.
בבקר תאמר מי יתן ערב ובערב תאמר מי יתן בקר מפחד לבבך אשר תפחד וממראה עיניך אשר תראה׃ 67
Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.
והשיבך יהוה מצרים באניות בדרך אשר אמרתי לך לא תסיף עוד לראתה והתמכרתם שם לאיביך לעבדים ולשפחות ואין קנה׃ 68
Onyenwe anyị ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị.

< דברים 28 >