< שמואל ב 13 >

ויהי אחרי כן ולאבשלום בן דוד אחות יפה ושמה תמר ויאהבה אמנון בן דוד׃ 1
Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.
ויצר לאמנון להתחלות בעבור תמר אחתו כי בתולה היא ויפלא בעיני אמנון לעשות לה מאומה׃ 2
Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
ולאמנון רע ושמו יונדב בן שמעה אחי דוד ויונדב איש חכם מאד׃ 3
Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.
ויאמר לו מדוע אתה ככה דל בן המלך בבקר בבקר הלוא תגיד לי ויאמר לו אמנון את תמר אחות אבשלם אחי אני אהב׃ 4
Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”
ויאמר לו יהונדב שכב על משכבך והתחל ובא אביך לראותך ואמרת אליו תבא נא תמר אחותי ותברני לחם ועשתה לעיני את הבריה למען אשר אראה ואכלתי מידה׃ 5
Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’”
וישכב אמנון ויתחל ויבא המלך לראתו ויאמר אמנון אל המלך תבוא נא תמר אחתי ותלבב לעיני שתי לבבות ואברה מידה׃ 6
Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”
וישלח דוד אל תמר הביתה לאמר לכי נא בית אמנון אחיך ועשי לו הבריה׃ 7
Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.
ותלך תמר בית אמנון אחיה והוא שכב ותקח את הבצק ותלוש ותלבב לעיניו ותבשל את הלבבות׃ 8
Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.
ותקח את המשרת ותצק לפניו וימאן לאכול ויאמר אמנון הוציאו כל איש מעלי ויצאו כל איש מעליו׃ 9
Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya. Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara.
ויאמר אמנון אל תמר הביאי הבריה החדר ואברה מידך ותקח תמר את הלבבות אשר עשתה ותבא לאמנון אחיה החדרה׃ 10
Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.
ותגש אליו לאכל ויחזק בה ויאמר לה בואי שכבי עמי אחותי׃ 11
Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.”
ותאמר לו אל אחי אל תענני כי לא יעשה כן בישראל אל תעשה את הנבלה הזאת׃ 12
Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a.
ואני אנה אוליך את חרפתי ואתה תהיה כאחד הנבלים בישראל ועתה דבר נא אל המלך כי לא ימנעני ממך׃ 13
Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”
ולא אבה לשמע בקולה ויחזק ממנה ויענה וישכב אתה׃ 14
Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.
וישנאה אמנון שנאה גדולה מאד כי גדולה השנאה אשר שנאה מאהבה אשר אהבה ויאמר לה אמנון קומי לכי׃ 15
Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”
ותאמר לו אל אודת הרעה הגדולה הזאת מאחרת אשר עשית עמי לשלחני ולא אבה לשמע לה׃ 16
Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.
ויקרא את נערו משרתו ויאמר שלחו נא את זאת מעלי החוצה ונעל הדלת אחריה׃ 17
Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”
ועליה כתנת פסים כי כן תלבשן בנות המלך הבתולת מעילים ויצא אותה משרתו החוץ ונעל הדלת אחריה׃ 18
Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
ותקח תמר אפר על ראשה וכתנת הפסים אשר עליה קרעה ותשם ידה על ראשה ותלך הלוך וזעקה׃ 19
Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.
ויאמר אליה אבשלום אחיה האמינון אחיך היה עמך ועתה אחותי החרישי אחיך הוא אל תשיתי את לבך לדבר הזה ותשב תמר ושממה בית אבשלום אחיה׃ 20
Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.
והמלך דוד שמע את כל הדברים האלה ויחר לו מאד׃ 21
Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu.
ולא דבר אבשלום עם אמנון למרע ועד טוב כי שנא אבשלום את אמנון על דבר אשר ענה את תמר אחתו׃ 22
Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.
ויהי לשנתים ימים ויהיו גזזים לאבשלום בבעל חצור אשר עם אפרים ויקרא אבשלום לכל בני המלך׃ 23
Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.
ויבא אבשלום אל המלך ויאמר הנה נא גזזים לעבדך ילך נא המלך ועבדיו עם עבדך׃ 24
Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”
ויאמר המלך אל אבשלום אל בני אל נא נלך כלנו ולא נכבד עליך ויפרץ בו ולא אבה ללכת ויברכהו׃ 25
Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.
ויאמר אבשלום ולא ילך נא אתנו אמנון אחי ויאמר לו המלך למה ילך עמך׃ 26
Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”
ויפרץ בו אבשלום וישלח אתו את אמנון ואת כל בני המלך׃ 27
Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa.
ויצו אבשלום את נעריו לאמר ראו נא כטוב לב אמנון ביין ואמרתי אליכם הכו את אמנון והמתם אתו אל תיראו הלוא כי אנכי צויתי אתכם חזקו והיו לבני חיל׃ 28
Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
ויעשו נערי אבשלום לאמנון כאשר צוה אבשלום ויקמו כל בני המלך וירכבו איש על פרדו וינסו׃ 29
Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga.
ויהי המה בדרך והשמעה באה אל דוד לאמר הכה אבשלום את כל בני המלך ולא נותר מהם אחד׃ 30
Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
ויקם המלך ויקרע את בגדיו וישכב ארצה וכל עבדיו נצבים קרעי בגדים׃ 31
Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.
ויען יונדב בן שמעה אחי דוד ויאמר אל יאמר אדני את כל הנערים בני המלך המיתו כי אמנון לבדו מת כי על פי אבשלום היתה שימה מיום ענתו את תמר אחתו׃ 32
Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.
ועתה אל ישם אדני המלך אל לבו דבר לאמר כל בני המלך מתו כי אם אמנון לבדו מת׃ 33
Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.”
ויברח אבשלום וישא הנער הצפה את עינו וירא והנה עם רב הלכים מדרך אחריו מצד ההר׃ 34
Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.”
ויאמר יונדב אל המלך הנה בני המלך באו כדבר עבדך כן היה׃ 35
Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.”
ויהי ככלתו לדבר והנה בני המלך באו וישאו קולם ויבכו וגם המלך וכל עבדיו בכו בכי גדול מאד׃ 36
Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.
ואבשלום ברח וילך אל תלמי בן עמיחור מלך גשור ויתאבל על בנו כל הימים׃ 37
Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn.
ואבשלום ברח וילך גשור ויהי שם שלש שנים׃ 38
Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ.
ותכל דוד המלך לצאת אל אבשלום כי נחם על אמנון כי מת׃ 39
Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.

< שמואל ב 13 >