< דברי הימים ב 11 >

ויבא רחבעם ירושלם ויקהל את בית יהודה ובנימן מאה ושמונים אלף בחור עשה מלחמה להלחם עם ישראל להשיב את הממלכה לרחבעם׃ 1
Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam.
ויהי דבר יהוה אל שמעיהו איש האלהים לאמר׃ 2
Ma okwu Onyenwe anyị rutere Shemaya, onye nke Chineke ntị:
אמר אל רחבעם בן שלמה מלך יהודה ואל כל ישראל ביהודה ובנימן לאמר׃ 3
“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na Izrel niile nọ na Juda na Benjamin,
כה אמר יהוה לא תעלו ולא תלחמו עם אחיכם שובו איש לביתו כי מאתי נהיה הדבר הזה וישמעו את דברי יהוה וישבו מלכת אל ירבעם׃ 4
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ndị Izrel ibe unu agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme ihe ndị a.’” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu niile nke Onyenwe anyị. Ha tụgharịrị laghachi azụ nʼịga megide Jeroboam.
וישב רחבעם בירושלם ויבן ערים למצור ביהודה׃ 5
Rehoboam bigidere na Jerusalem wusie obodo ndị dị na Juda ike nʼihi nchedo.
ויבן את בית לחם ואת עיטם ואת תקוע׃ 6
Obodo ndị a bụ Betlehem, Etam, Tekoa,
ואת בית צור ואת שוכו ואת עדלם׃ 7
Bet Zoa, Soko, Adulam,
ואת גת ואת מרשה ואת זיף׃ 8
Gat, Maresha, Zif,
ואת אדורים ואת לכיש ואת עזקה׃ 9
na Adoraim, Lakish, Azeka
ואת צרעה ואת אילון ואת חברון אשר ביהודה ובבנימן ערי מצרות׃ 10
Zora, Aijalon na Hebrọn. Obodo ndị a bụkwa obodo ndị Juda na Benjamin e wusiri ike.
ויחזק את המצרות ויתן בהם נגידים ואצרות מאכל ושמן ויין׃ 11
O wusiri ha ike tinye ndịisi agha nʼime ha, tinyekwa ihe oriri na mmanụ oliv na mmanya.
ובכל עיר ועיר צנות ורמחים ויחזקם להרבה מאד ויהי לו יהודה ובנימן׃ 12
O tinyere ọta na ùbe nʼebe niile a na-edebe ngwa agha nʼobodo niile, nʼihi iche obodo ya nke ọma, ebe ọ bụ naanị Juda na Benjamin nọ nʼokpuru ya.
והכהנים והלוים אשר בכל ישראל התיצבו עליו מכל גבולם׃ 13
Ma ndị nchụaja niile na ndị Livayị ndị sitere nʼakụkụ niile nke Izrel dịnyere ya.
כי עזבו הלוים את מגרשיהם ואחזתם וילכו ליהודה ולירושלם כי הזניחם ירבעם ובניו מכהן ליהוה׃ 14
Ndị Livayị hapụchara ebe ịta nri anụ ụlọ ha na ihe niile ha nwere bịa biri na Juda na Jerusalem, nʼihi na Jeroboam na ụmụ ya ndị ikom jụrụ ha dịka ndị nchụaja Onyenwe anyị.
ויעמד לו כהנים לבמות ולשעירים ולעגלים אשר עשה׃ 15
Ọ họpụtara ndị nchụaja nke aka ya, maka ebe niile dị elu, nakwa ife arụsị ewu na nwa ehi ndị ahụ ọ kpụrụ.
ואחריהם מכל שבטי ישראל הנתנים את לבבם לבקש את יהוה אלהי ישראל באו ירושלם לזבוח ליהוה אלהי אבותיהם׃ 16
Ndị si nʼebo niile nke Izrel, ndị kpebiri nʼobi ha ịchọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel sooro ndị Livayị bịa Jerusalem ịchụ aja nye Onyenwe anyị Chineke nna nna ha.
ויחזקו את מלכות יהודה ויאמצו את רחבעם בן שלמה לשנים שלוש כי הלכו בדרך דויד ושלמה לשנים שלוש׃ 17
Ha mere ka alaeze Juda sie ike. Ha kwagidekwara Rehoboam nwa Solomọn afọ atọ, na-agbasokwa nʼụzọ niile nke Devid na Solomọn nʼoge a.
ויקח לו רחבעם אשה את מחלת בן ירימות בן דויד אביהיל בת אליאב בן ישי׃ 18
Rehoboam, lụrụ Mahalat, bụ nwa nwanyị Jerimot nwa Devid, na Abihail, nwa nwanyị Eliab, nwa Jesi.
ותלד לו בנים את יעוש ואת שמריה ואת זהם׃ 19
Ọ mụtaara ya ụmụ ndị ikom atọ ndị a: Jeush, na Shemaraya, na Zaham.
ואחריה לקח את מעכה בת אבשלום ותלד לו את אביה ואת עתי ואת זיזא ואת שלמית׃ 20
Emesịa, ọ lụkwara nwunye ọzọ aha ya bụ Maaka, nwa nwanyị Absalọm. Ụmụ ha mụtara bụ Abija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.
ויאהב רחבעם את מעכה בת אבשלום מכל נשיו ופילגשיו כי נשים שמונה עשרה נשא ופילגשים ששים ויולד עשרים ושמונה בנים וששים בנות׃ 21
Rehoboam hụrụ Maaka nwa nwanyị Absalọm nʼanya karịa ndị nwunye ya na ndị iko ya nwanyị niile. O nwere ndị nwunye iri na asatọ, nweekwa iri ndị iko nwanyị isii. Ọ mụtara iri ndị ikom abụọ na asatọ, na iri ụmụ nwanyị isii.
ויעמד לראש רחבעם את אביה בן מעכה לנגיד באחיו כי להמליכו׃ 22
Rehoboam mere Abija nwa Maaka onyeisi nʼetiti ụmụ eze niile nʼihi na ọ chọrọ ime ya eze.
ויבן ויפרץ מכל בניו לכל ארצות יהודה ובנימן לכל ערי המצרות ויתן להם המזון לרב וישאל המון נשים׃ 23
O ji ezi uche zipụchaa ụmụ ya ndị ikom gaa nʼala ndị Juda na Benjamin, nakwa nʼobodo ndị ahụ e wusiri ike. O nyere ha ihe e ji elekọta ndụ nʼebe ọ bara ụba ma lụọkwara ha ọtụtụ ndị inyom.

< דברי הימים ב 11 >