< שמואל א 14 >

ויהי היום ויאמר יונתן בן שאול אל הנער נשא כליו לכה ונעברה אל מצב פלשתים אשר מעבר הלז ולאביו לא הגיד׃ 1
Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya.
ושאול יושב בקצה הגבעה תחת הרמון אשר במגרון והעם אשר עמו כשש מאות איש׃ 2
Sọl na narị ndị ikom isii ya na-anọdụ nʼebe dị anya site na Gibea, nʼokpuru osisi pomegranet dị na Migrọn.
ואחיה בן אחטוב אחי איכבוד בן פינחס בן עלי כהן יהוה בשלו נשא אפוד והעם לא ידע כי הלך יונתן׃ 3
Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.
ובין המעברות אשר בקש יונתן לעבר על מצב פלשתים שן הסלע מהעבר מזה ושן הסלע מהעבר מזה ושם האחד בוצץ ושם האחד סנה׃ 4
Tupu Jonatan eruo ebe ndị Filistia nọ, ọ ghaghị isite na nwa ụzọ warawara dị nʼagbata nkume abụọ, a na-akpọ Bozez na Sene gabiga.
השן האחד מצוק מצפון מול מכמש והאחד מנגב מול גבע׃ 5
Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba.
ויאמר יהונתן אל הנער נשא כליו לכה ונעברה אל מצב הערלים האלה אולי יעשה יהוה לנו כי אין ליהוה מעצור להושיע ברב או במעט׃ 6
Jonatan gwara nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ga nʼebe nguzo ndị ahụ a na-ebighị ugwu, ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-alụrụ anyị ọgụ. Nʼihi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onyenwe anyị ịzọpụta, site nʼọtụtụ mmadụ, maọbụ ole na ole.”
ויאמר לו נשא כליו עשה כל אשר בלבבך נטה לך הנני עמך כלבבך׃ 7
Nwokorobịa ahụ zara sị ya, “Gaa nʼihu, eji m obi m na mmụọ m na-eso gị dịka ọchịchọ gị si dị.”
ויאמר יהונתן הנה אנחנו עברים אל האנשים ונגלינו אליהם׃ 8
Jonatan gwara ya sị, “Bịa ka anyị ga, lee ihe anyị ga-eme. Anyị ga-apụkwuru ndị agha ahụ mee ka ha hụ anyị anya.
אם כה יאמרו אלינו דמו עד הגיענו אליכם ועמדנו תחתינו ולא נעלה אליהם׃ 9
Ọ bụrụ na ha asị, ‘Guzonụ ebe ahụ ruo mgbe anyị bịakwutere unu,’ anyị ga-echere ebe anyị nọ, anyị agaghị agakwuru ha.
ואם כה יאמרו עלו עלינו ועלינו כי נתנם יהוה בידנו וזה לנו האות׃ 10
Ma ọ bụrụ na ha sị, ‘Rigokwutenụ anyị,’ anyị ga-emekwa otu ahụ, nʼihi na ọ ga-abụrụ anyị ihe ama na Onyenwe anyị enyela ha nʼaka anyị.”
ויגלו שניהם אל מצב פלשתים ויאמרו פלשתים הנה עברים יצאים מן החרים אשר התחבאו שם׃ 11
Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”
ויענו אנשי המצבה את יונתן ואת נשא כליו ויאמרו עלו אלינו ונודיעה אתכם דבר ויאמר יונתן אל נשא כליו עלה אחרי כי נתנם יהוה ביד ישראל׃ 12
Ndị ikom ndị na-anọ nʼebe nguzo ndị nche tikuru Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya sị, “Rigokwutenụ anyị, ka anyị mee unu ihe.” Jonatan gwara onye ahụ na-ebu ngwa agha, “Soro m nʼazụ rigota, nʼihi na Onyenwe anyị ewerela ha nyefee nʼaka Izrel.”
ויעל יונתן על ידיו ועל רגליו ונשא כליו אחריו ויפלו לפני יונתן ונשא כליו ממותת אחריו׃ 13
Ya mere, Jonatan ji ikpere ya na aka ya rigoruo nʼebe ahụ; onye na-ebu ihe agha ya sokwa ya nʼazụ. Ma ndị agha Filistia daghachiri azụ mgbe Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya bidoro igbu ha.
ותהי המכה הראשנה אשר הכה יונתן ונשא כליו כעשרים איש כבחצי מענה צמד שדה׃ 14
Na ogbugbu mbụ ahụ, Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya gburu ọnụọgụgụ ndị Filistia dị iri abụọ. Ọ bụ nʼihe ha ka nketa ala ruru otu ọkara nʼekaa nʼọtụtụ.
ותהי חרדה במחנה בשדה ובכל העם המצב והמשחית חרדו גם המה ותרגז הארץ ותהי לחרדת אלהים׃ 15
Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere.
ויראו הצפים לשאול בגבעת בנימן והנה ההמון נמוג וילך והלם׃ 16
Ndị nche Sọl, bụ ndị nọ na Gibea nʼime Benjamin, lepụrụ anya hụ igwe ndị agha ka ha malitere ịgba barịị nʼihu na-azụ.
ויאמר שאול לעם אשר אתו פקדו נא וראו מי הלך מעמנו ויפקדו והנה אין יונתן ונשא כליו׃ 17
Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya na ha so, “Gụọnụ ndị agha ọnụ, chọpụta onye na-anọghị nʼebe a.” Mgbe ha mere nke a, ha chọpụtara, na Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya anọghị nʼebe ahụ.
ויאמר שאול לאחיה הגישה ארון האלהים כי היה ארון האלהים ביום ההוא ובני ישראל׃ 18
Sọl sịrị Ahija, “Bute igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” (Nʼoge ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị nʼaka ụmụ Izrel.)
ויהי עד דבר שאול אל הכהן וההמון אשר במחנה פלשתים וילך הלוך ורב ויאמר שאול אל הכהן אסף ידך׃ 19
Mgbe Sọl na-agwa onye nchụaja okwu, ụzụ na iti mkpu nke na-ada nʼụlọ ikwu ndị Filistia dara karịa, nʼihi ya, Sọl gwara onye nchụaja ahụ okwu sị ya, “Sepụ aka gị.”
ויזעק שאול וכל העם אשר אתו ויבאו עד המלחמה והנה היתה חרב איש ברעהו מהומה גדולה מאד׃ 20
Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.
והעברים היו לפלשתים כאתמול שלשום אשר עלו עמם במחנה סביב וגם המה להיות עם ישראל אשר עם שאול ויונתן׃ 21
Ma ndị Hibru, ndị so ndị Filistia na-alụ ọgụ, tụgharịrị dịnyere ndị Izrel soro Sọl na Jonatan.
וכל איש ישראל המתחבאים בהר אפרים שמעו כי נסו פלשתים וידבקו גם המה אחריהם במלחמה׃ 22
Emesịa, ndị ikom Izrel niile, ndị ahụ zoro onwe ha nʼala ugwu ugwu Ifrem pụtara, mgbe ha hụrụ na ndị Filistia na-agba ọsọ. Ha gbapụtara soro ndị ọzọ ịchụ ndị Filistia ọsọ.
ויושע יהוה ביום ההוא את ישראל והמלחמה עברה את בית און׃ 23
Ya mere, Onyenwe anyị napụtara ndị Izrel nʼụbọchị ahụ. E buru agha ahụ gabiga Bet-Aven.
ואיש ישראל נגש ביום ההוא ויאל שאול את העם לאמר ארור האיש אשר יאכל לחם עד הערב ונקמתי מאיבי ולא טעם כל העם לחם׃ 24
Ma ndị ikom Izrel nọ ọnọdụ nhụju anya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na Sọl jiri ịṅụ iyi kechie ha, mgbe o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ onye ga-eri nri ọbụla site ugbu a ruo anyasị, tutu ruo mgbe m bọsịrị ọbọ megide ndị iro m!” Nʼihi ya, o nweghị onye ọbụla nʼetiti ndị agha ya detụrụ ihe oriri ọnụ.
וכל הארץ באו ביער ויהי דבש על פני השדה׃ 25
Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala.
ויבא העם אל היער והנה הלך דבש ואין משיג ידו אל פיו כי ירא העם את השבעה׃ 26
Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ.
ויונתן לא שמע בהשביע אביו את העם וישלח את קצה המטה אשר בידו ויטבל אותה ביערת הדבש וישב ידו אל פיו ותראנה עיניו׃ 27
Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.
ויען איש מהעם ויאמר השבע השביע אביך את העם לאמר ארור האיש אשר יאכל לחם היום ויעף העם׃ 28
Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’”
ויאמר יונתן עכר אבי את הארץ ראו נא כי ארו עיני כי טעמתי מעט דבש הזה׃ 29
Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.
אף כי לוא אכל אכל היום העם משלל איביו אשר מצא כי עתה לא רבתה מכה בפלשתים׃ 30
Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?”
ויכו ביום ההוא בפלשתים ממכמש אילנה ויעף העם מאד׃ 31
Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa.
ויעש העם אל שלל ויקחו צאן ובקר ובני בקר וישחטו ארצה ויאכל העם על הדם׃ 32
Ha dakwasịrị ihe a kwatara nʼagha, gbuo atụrụ na ehi na ụmụ ehi, bido iri anụ ha na ndụ nʼihi agụụ.
ויגידו לשאול לאמר הנה העם חטאים ליהוה לאכל על הדם ויאמר בגדתם גלו אלי היום אבן גדולה׃ 33
Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide Onyenwe anyị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.”
ויאמר שאול פצו בעם ואמרתם להם הגישו אלי איש שורו ואיש שיהו ושחטתם בזה ואכלתם ולא תחטאו ליהוה לאכל אל הדם ויגשו כל העם איש שורו בידו הלילה וישחטו שם׃ 34
Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide Onyenwe anyị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ.
ויבן שאול מזבח ליהוה אתו החל לבנות מזבח ליהוה׃ 35
Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.
ויאמר שאול נרדה אחרי פלשתים לילה ונבזה בהם עד אור הבקר ולא נשאר בהם איש ויאמרו כל הטוב בעיניך עשה ויאמר הכהן נקרבה הלם אל האלהים׃ 36
Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”
וישאל שאול באלהים הארד אחרי פלשתים התתנם ביד ישראל ולא ענהו ביום ההוא׃ 37
Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ.
ויאמר שאול גשו הלם כל פנות העם ודעו וראו במה היתה החטאת הזאת היום׃ 38
Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.
כי חי יהוה המושיע את ישראל כי אם ישנו ביונתן בני כי מות ימות ואין ענהו מכל העם׃ 39
Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla.
ויאמר אל כל ישראל אתם תהיו לעבר אחד ואני ויונתן בני נהיה לעבר אחד ויאמרו העם אל שאול הטוב בעיניך עשה׃ 40
Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”
ויאמר שאול אל יהוה אלהי ישראל הבה תמים וילכד יונתן ושאול והעם יצאו׃ 41
Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara, nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel.
ויאמר שאול הפילו ביני ובין יונתן בני וילכד יונתן׃ 42
Mgbe ahụ, Sọl kwuru sị, “Ugbu a feenụ nza nʼetiti mụ na Jonatan, nwa m nwoke.” Nza ahụ mara Jonatan.
ויאמר שאול אל יונתן הגידה לי מה עשיתה ויגד לו יונתן ויאמר טעם טעמתי בקצה המטה אשר בידי מעט דבש הנני אמות׃ 43
Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?”
ויאמר שאול כה יעשה אלהים וכה יוסף כי מות תמות יונתן׃ 44
Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Nʼezie Jonatan, ị ghaghị ịnwụ. Ka Chineke meso m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si sie ike, ma ọ bụrụ na ị nwụghị nʼihi ihe a i mere.”
ויאמר העם אל שאול היונתן ימות אשר עשה הישועה הגדולה הזאת בישראל חלילה חי יהוה אם יפל משערת ראשו ארצה כי עם אלהים עשה היום הזה ויפדו העם את יונתן ולא מת׃ 45
Ma ndị ikom ahụ sịrị Sọl, “Jonatan ọ ga-anwụ, bụ onye a wetara nzọpụta a dị ukwuu nʼIzrel? Nke a apụghị ime! Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụladị otu agịrị isi agaghị esi nʼisi ya dapụ, nʼihi na Chineke ejirila ya rụọ ọrụ ịtụnanya dị ukwuu taa.” Ya mere, ndị agha ahụ zọpụtara Jonatan, e gbukwaghị ya.
ויעל שאול מאחרי פלשתים ופלשתים הלכו למקומם׃ 46
Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha.
ושאול לכד המלוכה על ישראל וילחם סביב בכל איביו במואב ובבני עמון ובאדום ובמלכי צובה ובפלשתים ובכל אשר יפנה ירשיע׃ 47
Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.
ויעש חיל ויך את עמלק ויצל את ישראל מיד שסהו׃ 48
O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere.
ויהיו בני שאול יונתן וישוי ומלכי שוע ושם שתי בנתיו שם הבכירה מרב ושם הקטנה מיכל׃ 49
Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal.
ושם אשת שאול אחינעם בת אחימעץ ושם שר צבאו אבינר בן נר דוד שאול׃ 50
Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl.
וקיש אבי שאול ונר אבי אבנר בן אביאל׃ 51
Nea, nna Abna, na Kish, nna Sọl bụ ụmụnne. Ha bụ ụmụ Abiel.
ותהי המלחמה חזקה על פלשתים כל ימי שאול וראה שאול כל איש גבור וכל בן חיל ויאספהו אליו׃ 52
Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.

< שמואל א 14 >