< שמואל א 10 >

ויקח שמואל את פך השמן ויצק על ראשו וישקהו ויאמר הלוא כי משחך יהוה על נחלתו לנגיד׃ 1
Mgbe ahụ, Samuel weere karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi, sutukwa ya ọnụ nʼagba sị ya, “Ọ bụ na Onyenwe anyị etebeghị gị mmanụ ime gị onyendu ihe nketa ya?
בלכתך היום מעמדי ומצאת שני אנשים עם קברת רחל בגבול בנימן בצלצח ואמרו אליך נמצאו האתנות אשר הלכת לבקש והנה נטש אביך את דברי האתנות ודאג לכם לאמר מה אעשה לבני׃ 2
Mgbe ị ga-ahapụ m nʼebe a, ị ga-ahụ ndị ikom abụọ nʼakụkụ ili Rechel na Zelza, nʼala Benjamin, ha ga-agwa gị, ‘A chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ugbu a, nna gị akwụsịla iche ihe gbasara ịnyịnya ibu ya, ma ọ nọkwa na-echegbu onwe ya nʼihi gị, ọ na-ajụ, “Olee ihe m ga-eme banyere ọkpara m?”’
וחלפת משם והלאה ובאת עד אלון תבור ומצאוך שם שלשה אנשים עלים אל האלהים בית אל אחד נשא שלשה גדיים ואחד נשא שלשת ככרות לחם ואחד נשא נבל יין׃ 3
“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
ושאלו לך לשלום ונתנו לך שתי לחם ולקחת מידם׃ 4
Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.
אחר כן תבוא גבעת האלהים אשר שם נצבי פלשתים ויהי כבאך שם העיר ופגעת חבל נביאים ירדים מהבמה ולפניהם נבל ותף וחליל וכנור והמה מתנבאים׃ 5
“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
וצלחה עליך רוח יהוה והתנבית עמם ונהפכת לאיש אחר׃ 6
Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
והיה כי תבאינה האתות האלה לך עשה לך אשר תמצא ידך כי האלהים עמך׃ 7
Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
וירדת לפני הגלגל והנה אנכי ירד אליך להעלות עלות לזבח זבחי שלמים שבעת ימים תוחל עד בואי אליך והודעתי לך את אשר תעשה׃ 8
“Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
והיה כהפנתו שכמו ללכת מעם שמואל ויהפך לו אלהים לב אחר ויבאו כל האתות האלה ביום ההוא׃ 9
Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
ויבאו שם הגבעתה והנה חבל נבאים לקראתו ותצלח עליו רוח אלהים ויתנבא בתוכם׃ 10
Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
ויהי כל יודעו מאתמול שלשום ויראו והנה עם נבאים נבא ויאמר העם איש אל רעהו מה זה היה לבן קיש הגם שאול בנביאים׃ 11
Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
ויען איש משם ויאמר ומי אביהם על כן היתה למשל הגם שאול בנבאים׃ 12
Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
ויכל מהתנבות ויבא הבמה׃ 13
Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.
ויאמר דוד שאול אליו ואל נערו אן הלכתם ויאמר לבקש את האתנות ונראה כי אין ונבוא אל שמואל׃ 14
Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”
ויאמר דוד שאול הגידה נא לי מה אמר לכם שמואל׃ 15
Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
ויאמר שאול אל דודו הגד הגיד לנו כי נמצאו האתנות ואת דבר המלוכה לא הגיד לו אשר אמר שמואל׃ 16
Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.
ויצעק שמואל את העם אל יהוה המצפה׃ 17
Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
ויאמר אל בני ישראל כה אמר יהוה אלהי ישראל אנכי העליתי את ישראל ממצרים ואציל אתכם מיד מצרים ומיד כל הממלכות הלחצים אתכם׃ 18
Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
ואתם היום מאסתם את אלהיכם אשר הוא מושיע לכם מכל רעותיכם וצרתיכם ותאמרו לו כי מלך תשים עלינו ועתה התיצבו לפני יהוה לשבטיכם ולאלפיכם׃ 19
Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”
ויקרב שמואל את כל שבטי ישראל וילכד שבט בנימן׃ 20
Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.
ויקרב את שבט בנימן למשפחתו ותלכד משפחת המטרי וילכד שאול בן קיש ויבקשהו ולא נמצא׃ 21
O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.
וישאלו עוד ביהוה הבא עוד הלם איש ויאמר יהוה הנה הוא נחבא אל הכלים׃ 22
Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”
וירצו ויקחהו משם ויתיצב בתוך העם ויגבה מכל העם משכמו ומעלה׃ 23
Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.
ויאמר שמואל אל כל העם הראיתם אשר בחר בו יהוה כי אין כמהו בכל העם וירעו כל העם ויאמרו יחי המלך׃ 24
Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”
וידבר שמואל אל העם את משפט המלכה ויכתב בספר וינח לפני יהוה וישלח שמואל את כל העם איש לביתו׃ 25
Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.
וגם שאול הלך לביתו גבעתה וילכו עמו החיל אשר נגע אלהים בלבם׃ 26
Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.
ובני בליעל אמרו מה ישענו זה ויבזהו ולא הביאו לו מנחה ויהי כמחריש׃ 27
Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

< שמואל א 10 >