< אִיּוֹב 8 >

וַ֭יַּעַן בִּלְדַּ֥ד הַשּׁוּחִ֗י וַיֹאמַֽר׃ 1
Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:
עַד־אָ֥ן תְּמַלֶּל־אֵ֑לֶּה וְר֥וּחַ כַּ֝בִּיר אִמְרֵי־פִֽיךָ׃ 2
“Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a? Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.
הַ֭אֵל יְעַוֵּ֣ת מִשְׁפָּ֑ט וְאִם־שַׁ֝דַּ֗י יְעַוֵּֽת־צֶֽדֶק׃ 3
Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?
אִם־בָּנֶ֥יךָ חָֽטְאוּ־לֹ֑ו וַֽ֝יְשַׁלְּחֵ֗ם בְּיַד־פִּשְׁעָֽם׃ 4
Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.
אִם־אַ֭תָּה תְּשַׁחֵ֣ר אֶל־אֵ֑ל וְאֶל־שַׁ֝דַּ֗י תִּתְחַנָּֽן׃ 5
Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,
אִם־זַ֥ךְ וְיָשָׁ֗ר אָ֥תָּה כִּי־עַ֭תָּה יָעִ֣יר עָלֶ֑יךָ וְ֝שִׁלַּ֗ם נְוַ֣ת צִדְקֶֽךָ׃ 6
ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.
וְהָיָ֣ה רֵאשִׁיתְךָ֣ מִצְעָ֑ר וְ֝אַחֲרִיתְךָ֗ יִשְׂגֶּ֥ה מְאֹֽד׃ 7
Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala, ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.
כִּֽי־שְׁאַל־נָ֭א לְדֹ֣ר רִישֹׁ֑ון וְ֝כֹונֵ֗ן לְחֵ֣קֶר אֲבֹותָֽם׃ 8
“Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.
כִּֽי־תְמֹ֣ול אֲ֭נַחְנוּ וְלֹ֣א נֵדָ֑ע כִּ֤י צֵ֖ל יָמֵ֣ינוּ עֲלֵי־אָֽרֶץ׃ 9
Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.
הֲלֹא־הֵ֣ם יֹ֭ורוּךָ יֹ֣אמְרוּ לָ֑ךְ וּ֝מִלִּבָּ֗ם יֹוצִ֥אוּ מִלִּֽים׃ 10
Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe? Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?
הֲיִֽגְאֶה־גֹּ֭מֶא בְּלֹ֣א בִצָּ֑ה יִשְׂגֶּה־אָ֥חוּ בְלִי־מָֽיִם׃ 11
Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị? Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?
עֹדֶ֣נּוּ בְ֭אִבֹּו לֹ֣א יִקָּטֵ֑ף וְלִפְנֵ֖י כָל־חָצִ֣יר יִיבָֽשׁ׃ 12
Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.
כֵּ֗ן אָ֭רְחֹות כָּל־שֹׁ֣כְחֵי אֵ֑ל וְתִקְוַ֖ת חָנֵ֣ף תֹּאבֵֽד׃ 13
Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.
אֲשֶׁר־יָקֹ֥וט כִּסְלֹ֑ו וּבֵ֥ית עַ֝כָּבִ֗ישׁ מִבְטַחֹֽו׃ 14
Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.
יִשָּׁעֵ֣ן עַל־בֵּ֭יתֹו וְלֹ֣א יַעֲמֹ֑ד יַחֲזִ֥יק בֹּ֝֗ו וְלֹ֣א יָקֽוּם׃ 15
Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.
רָטֹ֣ב ה֖וּא לִפְנֵי־שָׁ֑מֶשׁ וְעַ֥ל גַּ֝נָּתֹ֗ו יֹֽנַקְתֹּ֥ו תֵצֵֽא׃ 16
Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.
עַל־גַּ֭ל שָֽׁרָשָׁ֣יו יְסֻבָּ֑כוּ בֵּ֖ית אֲבָנִ֣ים יֶחֱזֶֽה׃ 17
Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.
אִם־יְבַלְּעֶ֥נּוּ מִמְּקֹומֹ֑ו וְכִ֥חֶשׁ בֹּ֝֗ו לֹ֣א רְאִיתִֽיךָ׃ 18
Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’
הֶן־ה֭וּא מְשֹׂ֣ושׂ דַּרְכֹּ֑ו וּ֝מֵעָפָ֗ר אַחֵ֥ר יִצְמָֽחוּ׃ 19
Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.
הֶן־אֵ֭ל לֹ֣א יִמְאַס־תָּ֑ם וְלֹֽא־יַ֝חֲזִ֗יק בְּיַד־מְרֵעִֽים׃ 20
“Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.
עַד־יְמַלֵּ֣ה שְׂחֹ֣וק פִּ֑יךָ וּשְׂפָתֶ֥יךָ תְרוּעָֽה׃ 21
Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.
שֹׂנְאֶ֥יךָ יִלְבְּשׁוּ־בֹ֑שֶׁת וְאֹ֖הֶל רְשָׁעִ֣ים אֵינֶֽנּוּ׃ פ 22
Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”

< אִיּוֹב 8 >