< תהילים 98 >

מזמור שירו ליהוה שיר חדש-- כי-נפלאות עשה הושיעה-לו ימינו וזרוע קדשו 1
Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta.
הודיע יהוה ישועתו לעיני הגוים גלה צדקתו 2
Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
זכר חסדו ואמונתו-- לבית ישראל ראו כל-אפסי-ארץ-- את ישועת אלהינו 3
O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
הריעו ליהוה כל-הארץ פצחו ורננו וזמרו 4
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
זמרו ליהוה בכנור בכנור וקול זמרה 5
werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
בחצצרות וקול שופר-- הריעו לפני המלך יהוה 6
jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
ירעם הים ומלאו תבל וישבי בה 7
Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
נהרות ימחאו-כף יחד הרים ירננו 8
Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
לפני יהוה-- כי בא לשפט הארץ ישפט-תבל בצדק ועמים במישרים 9
ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

< תהילים 98 >