< תהילים 108 >

שיר מזמור לדוד נכון לבי אלהים אשירה ואזמרה אף-כבודי 1
Abụ, Abụ Ọma Devid. Obi m dị njikere, o Chineke; aga m eji mkpụrụobi m niile bụọ abụ ma kụkwaa egwu.
עורה הנבל וכנור אעירה שחר 2
Teta! Ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
אודך בעמים יהוה ואזמרך בלאמים 3
Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
כי-גדול מעל-שמים חסדך ועד-שחקים אמתך 4
Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu karịa eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
רומה על-שמים אלהים ועל כל-הארץ כבודך 5
Ka e bulie gị elu, o Chineke, karịa eluigwe niile, ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
למען יחלצון ידידיך הושיעה ימינך וענני 6
Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
אלהים דבר בקדשו--אעלזה אחלקה שכם ועמק סכות אמדד 7
Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ, nyepụ ya.
לי גלעד לי מנשה ואפרים מעוז ראשי יהודה מחקקי 8
Gilead bụ nke m, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
מואב סיר רחצי--על-אדום אשליך נעלי עלי-פלשת אתרועע 9
Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
מי יבלני עיר מבצר מי נחני עד-אדום 10
Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
הלא-אלהים זנחתנו ולא-תצא אלהים בצבאתינו 11
Ọ bụghị gị, o Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
הבה-לנו עזרת מצר ושוא תשועת אדם 12
Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
באלהים נעשה-חיל והוא יבוס צרינו 13
Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.

< תהילים 108 >