< מִשְׁלֵי 30 >

דברי אגור בן-יקה--המשא נאם הגבר לאיתיאל לאיתיאל ואכל 1
Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa, Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal: “Ike agwụla m, Chineke ma a pụrụ imeri.
כי בער אנכי מאיש ולא-בינת אדם לי 2
Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla; Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe.
ולא-למדתי חכמה ודעת קדשים אדע 3
Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
מי עלה-שמים וירד מי אסף-רוח בחפניו מי צרר-מים בשמלה-- מי הקים כל-אפסי-ארץ מה-שמו ומה-שם-בנו כי תדע 4
Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa? Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya? Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya? Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ? Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya? Gịnịkwa bụ aha nwa ya?
כל-אמרת אלוה צרופה מגן הוא לחסים בו 5
“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
אל-תוסף על-דבריו פן-יוכיח בך ונכזבת 6
Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
שתים שאלתי מאתך אל-תמנע ממני בטרם אמות 7
“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
שוא ודבר-כזב הרחק ממני-- ראש ועשר אל-תתן-לי הטריפני לחם חקי 8
Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
פן אשבע וכחשתי-- ואמרתי מי יהוה ופן-אורש וגנבתי ותפשתי שם אלהי 9
Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.
אל-תלשן עבד אל-אדנו פן-יקללך ואשמת 10
“Ekwujọla ohu nʼihu nna ya ukwu, ka ọ ghara ịbụ gị ọnụ, ikpe amaa gị.
דור אביו יקלל ואת-אמו לא יברך 11
“Ọ dị ndị na-akọcha nna ha, ha adịghị agọzikwa nne ha;
דור טהור בעיניו ומצאתו לא רחץ 12
Ọgbọ ndị dị ọcha nʼanya nke onwe ha ma asapụbeghị isisi nʼunyi ha ruru.
דור מה-רמו עיניו ועפעפיו ינשאו 13
Ọ dị ndị anya ha dị nʼelu, ndị ile anya ha jupụtara na nlelị.
דור חרבות שניו-- ומאכלות מתלעתיו לאכל עניים מארץ ואביונים מאדם 14
Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ.
לעלוקה שתי בנות-- הב הב שלוש הנה לא תשבענה ארבע לא-אמרו הון 15
“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’
שאול ועצר-רחם ארץ לא-שבעה מים ואש לא-אמרה הון (Sheol h7585) 16
Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol h7585)
עין תלעג לאב-- ותבז ליקהת-אם יקרוה ערבי-נחל ויאכלוה בני-נשר 17
“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
שלשה המה נפלאו ממני וארבע (וארבעה) לא ידעתים 18
“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
דרך הנשר בשמים-- דרך נחש עלי-צור דרך-אניה בלב-ים-- ודרך גבר בעלמה 19
Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
כן דרך אשה-- מנאפת אכלה ומחתה פיה ואמרה לא-פעלתי און 20
“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
תחת שלוש רגזה ארץ ותחת ארבע לא-תוכל שאת 21
“Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
תחת-עבד כי ימלוך ונבל כי ישבע-לחם 22
Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma,
תחת שנואה כי תבעל ושפחה כי תירש גברתה 23
nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu.
ארבעה הם קטני-ארץ והמה חכמים מחכמים 24
“Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu.
הנמלים עם לא-עז ויכינו בקיץ לחמם 25
Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
שפנים עם לא-עצום וישימו בסלע ביתם 26
Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
מלך אין לארבה ויצא חצץ כלו 27
Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
שממית בידים תתפש והיא בהיכלי מלך 28
Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
שלשה המה מיטיבי צעד וארבעה מיטבי לכת 29
“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
ליש גבור בבהמה ולא-ישוב מפני-כל 30
Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
זרזיר מתנים או-תיש ומלך אלקום עמו 31
na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.
אם-נבלת בהתנשא ואם-זמות יד לפה 32
“Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere.
כי מיץ חלב יוציא חמאה-- ומיץ-אף יוציא דם ומיץ אפים יוציא ריב 33
A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”

< מִשְׁלֵי 30 >