< מִשְׁלֵי 10 >

משלי שלמה בן חכם ישמח-אב ובן כסיל תוגת אמו 1
Ilu dị iche iche nke Solomọn: Nwata maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa ọṅụ; ma nwantakịrị dị nzuzu na-ewetara nne ya nʼiru ụjụ.
לא-יועילו אוצרות רשע וצדקה תציל ממות 2
Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru, ma ezi omume na-azọpụta mmadụ site nʼọnwụ.
לא-ירעיב יהוה נפש צדיק והות רשעים יהדף 3
Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ, ọ gakwaghị ekwe ka ihe nọgide na-agara onye ajọ omume nke ọma.
ראש--עשה כף-רמיה ויד חרוצים תעשיר 4
Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye, ma aka na-arụsị ọrụ ike na-eweta ụba.
אגר בקיץ בן משכיל נרדם בקציר בן מביש 5
Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe, ma nwa ahụ nke na-arahụ ụra nʼoge ọrụ bụ nwa na-eweta ihere.
ברכות לראש צדיק ופי רשעים יכסה חמס 6
Onye ezi omume na-anata ngọzị, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
זכר צדיק לברכה ושם רשעים ירקב 7
Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị, ma aha onye ajọ omume ga-ere ure.
חכם-לב יקח מצות ואויל שפתים ילבט 8
Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu, ma onye nzuzu ekwurekwu ga-ala nʼiyi.
הולך בתם ילך בטח ומעקש דרכיו יודע 9
Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu, ma onye ụzọ ya ezighị ezi ka a ga-achọpụta.
קרץ עין יתן עצבת ואויל שפתים ילבט 10
Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute, onye nzuzu ekwurekwu ga-abịa nʼịla nʼiyi.
מקור חיים פי צדיק ופי רשעים יכסה חמס 11
Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ, ma naanị nkọcha jupụtara nʼọnụ onye ajọ omume.
שנאה תערר מדנים ועל כל-פשעים תכסה אהבה 12
Ịkpọ asị na-akpali esemokwu, ma ịhụnanya na-ekpuchi mmehie niile.
בשפתי נבון תמצא חכמה ושבט לגו חסר-לב 13
Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi, ma ndị na-enweghị uche ka a na-eti ihe dịka ohu.
חכמים יצפנו-דעת ופי-אויל מחתה קרבה 14
Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma, ma onye nzuzu na-eji ọnụ ya akpọ ịla nʼiyi oku.
הון עשיר קרית עזו מחתת דלים רישם 15
Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ma ụbịam bụ ịla nʼiyi nke ndị ogbenye.
פעלת צדיק לחיים תבואת רשע לחטאת 16
Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ, ma ihe nweta nke onye ajọ omume bụ mmehie na ọnwụ.
ארח לחיים שומר מוסר ועזב תוכחת מתעה 17
Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ, ma onye na-adịghị anabata ndụmọdụ na-eme ka ndị ọzọ kpafuo.
מכסה שנאה שפתי-שקר ומוצא דבה הוא כסיל 18
Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị na onye na-agbasa okwu nkwutọ bụ onye nzuzu.
ברב דברים לא יחדל-פשע וחושך שפתיו משכיל 19
Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị ma ndị nwere uche na-ejide ire ha.
כסף נבחר לשון צדיק לב רשעים כמעט 20
Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma, ma obi onye ajọ omume bụ ihe ọnụahịa nta.
שפתי צדיק ירעו רבים ואוילים בחסר-לב ימותו 21
Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ, ma ndị nzuzu na-anwụ nʼihi amamihe nke kọrọ ha.
ברכת יהוה היא תעשיר ולא-יוסף עצב עמה 22
Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya, ọ naghị atụkwasị ya nsogbu.
כשחוק לכסיל עשות זמה וחכמה לאיש תבונה 23
Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ; ma ihe na-atọ onye maara ihe ụtọ bụ inwe nghọta.
מגורת רשע היא תבואנו ותאות צדיקים יתן 24
Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya, ihe onye ezi omume na-achọ ka a ga-enye ya.
כעבור סופה ואין רשע וצדיק יסוד עולם 25
Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu; ma ndị ezi omume na-eguzosi ike ruo ebighị ebi.
כחמץ לשנים--וכעשן לעינים כן העצל לשלחיו 26
Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya; ọ dịka anwụrụ ọkụ nʼanya mmadụ maọbụ dịka mmanya gbara ụka nke na-ejiji eze.
יראת יהוה תוסיף ימים ושנות רשעים תקצרנה 27
Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ, ma ọnụọgụgụ afọ nke onye ajọ omume na-adị mkpụmkpụ.
תוחלת צדיקים שמחה ותקות רשעים תאבד 28
Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ; olileanya ndị na-emebi iwu bụ naanị ihe efu.
מעוז לתם דרך יהוה ומחתה לפעלי און 29
Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta, maọbụ ịla nʼiyi nye ndị na-eme ajọ ihe.
צדיק לעולם בל-ימוט ורשעים לא ישכנו-ארץ 30
A pụghị iwezuga onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu agaghị anọgide.
פי-צדיק ינוב חכמה ולשון תהפכות תכרת 31
Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa, ma ire na-ekwu okwu nduhie ka a ga-eme ka o dere duu.
שפתי צדיק ידעון רצון ופי רשעים תהפכות 32
Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma, ma ọnụ ndị ajọ omume bụ naanị okwu nduhie.

< מִשְׁלֵי 10 >