< ירמיה 24 >

הראני יהוה והנה שני דודאי תאנים מועדים לפני היכל יהוה אחרי הגלות נבוכדראצר מלך בבל את יכניהו בן יהויקים מלך יהודה ואת שרי יהודה ואת החרש ואת המסגר מירושלם ויבאם בבל 1
Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.
הדוד אחד תאנים טבות מאד כתאני הבכרות והדוד אחד תאנים רעות מאד אשר לא תאכלנה מרע 2
Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.
ויאמר יהוה אלי מה אתה ראה ירמיהו ואמר תאנים התאנים הטבות טבות מאד והרעות רעות מאד אשר לא תאכלנה מרע 3
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”
ויהי דבר יהוה אלי לאמר 4
Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
כה אמר יהוה אלהי ישראל כתאנים הטבות האלה כן אכיר את גלות יהודה אשר שלחתי מן המקום הזה ארץ כשדים--לטובה 5
“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel kwuru: Ndị ahụ m mere ka e si na Juda dọta nʼagha, ndị e buuru gaa nʼala Kaldịa dị m dịka mkpụrụ osisi fiig ndị a mara mma.
ושמתי עיני עליהם לטובה והשבתים על הארץ הזאת ובניתים ולא אהרס ונטעתים ולא אתוש 6
Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.
ונתתי להם לב לדעת אתי כי אני יהוה והיו לי לעם ואנכי אהיה להם לאלהים כי ישבו אלי בכל לבם 7
Aga m enye ha ụdị obi ha ga-eji mata m, na m bụ Onyenwe anyị. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. Nʼihi na obi ha niile ka ha ga-eji lọghachikwute m.
וכתאנים הרעות אשר לא תאכלנה מרע כי כה אמר יהוה כן אתן את צדקיהו מלך יהודה ואת שריו ואת שארית ירושלם הנשארים בארץ הזאת והישבים בארץ מצרים 8
“‘Ma dịka fiig ọjọọ ndị a, bụ ndị dị njọ nke ukwuu na-enweghị ike iri ha eri,’ Onyenwe anyị sịrị, ‘otu a ka m gaa emeso Zedekaya, eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ahụ niile fọdụrụ ndụ na Jerusalem, ma ha bi nʼime ya, maọbụ biri nʼIjipt.
ונתתים לזועה (לזעוה) לרעה לכל ממלכות הארץ לחרפה ולמשל לשנינה ולקללה בכל המקמות אשר אדיחם שם 9
Aga m eme ka ha ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe ịsọ oyi, na ihe na-eweta obi ọjọọ. Ha ga-aghọ ihe ịta ụta, na ihe e ji akọ akụkọ, na ihe nkọcha na ihe ịbụ ọnụ nʼebe ọbụla m mere ka ha gaa biri.
ושלחתי בם את החרב את הרעב ואת הדבר עד תמם מעל האדמה אשר נתתי להם ולאבותיהם 10
Aga m ezigakwa mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe nʼetiti ha, tutu ruo mgbe e mere ka ha gwụsịa nʼelu ala ahụ nke m nyere ha, nyekwa ndị bụ nna nna ha.’”

< ירמיה 24 >