< בראשית 8 >

ויזכר אלהים את נח ואת כל החיה ואת כל הבהמה אשר אתו בתבה ויעבר אלהים רוח על הארץ וישכו המים 1
Ma Chineke chetara Noa na ụmụ anụ ọhịa niile, na ụmụ anụ ụlọ niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ. O zitere ifufe, mee ka o fee nʼelu mmiri ahụ ime ka mmiri ahụ bido ịta.
ויסכרו מעינת תהום וארבת השמים ויכלא הגשם מן השמים 2
A kpọchiri isi iyi mmiri niile dị nʼime ime ala, kpọchiekwa ọnụ ụzọ mmiri ozuzo nke mbara eluigwe. Mmiri kwụsịrị isi na mbara eluigwe na-ezokwasị ụwa.
וישבו המים מעל הארץ הלוך ושוב ויחסרו המים--מקצה חמשים ומאת יום 3
Mmiri ahụ dị nʼụwa ji nwayọọ na-ata. Mgbe narị ụbọchị na iri ụbọchị ise gafesịrị, mmiri ahụ atalatala.
ותנח התבה בחדש השביעי בשבעה עשר יום לחדש על הרי אררט 4
Nʼụbọchị iri na asaa nke ọnwa asaa, ụgbọ mmiri ahụ gara nọkwasị nʼelu ugwu Ararat.
והמים היו הלוך וחסור עד החדש העשירי בעשירי באחד לחדש נראו ראשי ההרים 5
Mmiri a gara nʼihu na-ata ruo ọnwa nke iri. Nʼụbọchị nke mbụ nke ọnwa iri, e bidoro ịhụ elu ugwu ndị ọzọ anya.
ויהי מקץ ארבעים יום ויפתח נח את חלון התבה אשר עשה 6
Mgbe iri ụbọchị anọ gafere, Noa meghere oghereikuku ọ rụnyere nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ,
וישלח את הערב ויצא יצוא ושוב עד יבשת המים מעל הארץ 7
site nʼebe ahụ zipụ otu ugolọma nke na-efepụ na-efebatakwa, tutu ruo mgbe mmiri kọrọ nʼelu ala.
וישלח את היונה מאתו--לראות הקלו המים מעל פני האדמה 8
Emesịa, o zipụrụ otu nduru iji mata ma mmiri ọ kọọla nʼala,
ולא מצאה היונה מנוח לכף רגלה ותשב אליו אל התבה--כי מים על פני כל הארץ וישלח ידו ויקחה ויבא אתה אליו אל התבה 9
ma nduru ahụ achọtaghị ebe o nwere ike ibe, nʼihi na mmiri ka tojuru elu ụwa niile. Nʼihi ya, nduru ahụ lọghachikwutere Noa nʼime ụgbọ ahụ. Noa setịpụrụ aka ya nwụbata nduru ahụ nʼụgbọ.
ויחל עוד שבעת ימים אחרים ויסף שלח את היונה מן התבה 10
Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụrụ nduru ahụ ọzọ
ותבא אליו היונה לעת ערב והנה עלה זית טרף בפיה וידע נח כי קלו המים מעל הארץ 11
Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala.
וייחל עוד שבעת ימים אחרים וישלח את היונה ולא יספה שוב אליו עוד 12
Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ.
ויהי באחת ושש מאות שנה בראשון באחד לחדש חרבו המים מעל הארץ ויסר נח את מכסה התבה וירא והנה חרבו פני האדמה 13
Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.
ובחדש השני בשבעה ועשרים יום לחדש--יבשה הארץ 14
Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.
וידבר אלהים אל נח לאמר 15
Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,
צא מן התבה--אתה ואשתך ובניך ונשי בניך אתך 16
“Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
כל החיה אשר אתך מכל בשר בעוף ובבהמה ובכל הרמש הרמש על הארץ--הוצא (היצא) אתך ושרצו בארץ ופרו ורבו על הארץ 17
Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”
ויצא נח ובניו ואשתו ונשי בניו אתו 18
Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya.
כל החיה כל הרמש וכל העוף כל רומש על הארץ--למשפחתיהם יצאו מן התבה 19
Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.
ויבן נח מזבח ליהוה ויקח מכל הבהמה הטהרה ומכל העוף הטהור ויעל עלת במזבח 20
Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.
וירח יהוה את ריח הניחח ויאמר יהוה אל לבו לא אסף לקלל עוד את האדמה בעבור האדם כי יצר לב האדם רע מנעריו ולא אסף עוד להכות את כל חי כאשר עשיתי 21
Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.
עד כל ימי הארץ זרע וקציר וקר וחם וקיץ וחרף ויום ולילה--לא ישבתו 22
“Ogologo oge niile ụwa ga-anọgide, oge ịkụ mkpụrụ na oge iwe ihe ubi, oge oyi na oge okpomọkụ, ọkọchị na udu mmiri, ehihie na abalị, agaghị ebi.”

< בראשית 8 >

A Dove is Sent Forth from the Ark
A Dove is Sent Forth from the Ark