< דברי הימים א 6 >

בני לוי גרשון קהת ומררי 1
Livayị mụrụ ndị a: Geshọn, Kohat na Merari.
ובני קהת--עמרם יצהר וחברון ועזיאל 2
Kohat mụrụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
ובני עמרם אהרן ומשה ומרים ובני אהרן--נדב ואביהוא אלעזר ואיתמר 3
Amram mụrụ Erọn, Mosis na Miriam. Erọn mụrụ Nadab, Abihu, Elieza na Itama.
אלעזר הוליד את פינחס פינחס הליד את אבישוע 4
Elieza mụrụ Finehaz; Finehaz abụrụ nna Abishua
ואבישוע הוליד את בקי ובקי הוליד את עזי 5
Abishua bụ nna Buki, Buki abụrụ nna Uzi.
ועזי הוליד את זרחיה וזרחיה הוליד את מריות 6
Uzi mụrụ Zerahaya, Zerahaya amụọ Meraiot.
מריות הוליד את אמריה ואמריה הוליד את אחיטוב 7
Meraiot mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
ואחיטוב הוליד את צדוק וצדוק הוליד את אחימעץ 8
Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Ahimaaz.
ואחימעץ הוליד את עזריה ועזריה הוליד את יוחנן 9
Ahimaaz mụrụ Azaraya, Azaraya amụọ Johanan.
ויוחנן הוליד את עזריה הוא אשר כהן בבית אשר בנה שלמה בירושלם 10
Johanan mụrụ Azaraya ọ bụ ya bụ onye ahụ bụ onye nchụaja ụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn wuru na Jerusalem.
ויולד עזריה את אמריה ואמריה הוליד את אחיטוב 11
Azaraya mụrụ Amaraya, Amaraya amụọ Ahitub.
ואחיטוב הוליד את צדוק וצדוק הוליד את שלום 12
Ahitub mụrụ Zadọk, Zadọk amụọ Shalum.
ושלום הוליד את חלקיה וחלקיה הוליד את עזריה 13
Shalum mụrụ Hilkaya, Hilkaya amụọ Azaraya.
ועזריה הוליד את שריה ושריה הוליד את יהוצדק 14
Azaraya mụrụ Seraya, Seraya amụọ Jehozadak,
ויהוצדק הלך--בהגלות יהוה את יהודה וירושלם ביד נבכדנאצר 15
A dọtara Jehozadak nʼagha mgbe Onyenwe anyị mere ka Nebukadneza dọkpụrụ ndị Juda na Jerusalem nʼagha.
בני לוי גרשם קהת ומררי 16
Ụmụ ndị ikom Livayị bụ, Geshọm, Kohat na Merari.
ואלה שמות בני גרשום לבני ושמעי 17
Geshọm mụrụ Libni na Shimei.
ובני קהת--עמרם ויצהר וחברון ועזיאל 18
Ụmụ Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Uziel.
בני מררי מחלי ומשי ואלה משפחות הלוי לאבתיהם 19
Merari mụtara Mahali na Mushi. Ndị a bụ ikwu Livayị ndị e depụtara dịka aha nna ha si dị.
לגרשום--לבני בנו יחת בנו זמה בנו 20
Ikwu Geshọm bụ Libni, Jahat, Zima,
יואח בנו עדו בנו זרח בנו יאתרי בנו 21
Joa, Ido, Zera na Jeaterai.
בני קהת--עמינדב בנו קרח בנו אסיר בנו 22
Ikwu Kohat bụ Aminadab, Kora, Asịa,
אלקנה בנו ואביסף בנו ואסיר בנו 23
Elkena, Ebiasaf, Asịa,
תחת בנו אוריאל בנו עזיה בנו ושאול בנו 24
Tahat, Uriel, Ụzaya na Shaul.
ובני אלקנה--עמשי ואחימות 25
Ụmụ ụmụ Elkena bụ Amasai na Ahimot.
אלקנה--בנו (בני) אלקנה צופי בנו ונחת בנו 26
Ụmụ ụmụ Ahimot bụ Elkena, Zofai, Nahat,
אליאב בנו ירחם בנו אלקנה בנו 27
Eliab, Jeroham, Elkena na Samuel.
ובני שמואל הבכר ושני ואביה 28
Ụmụ Samuel bụ Juel, ọkpara ya, na Abija nke abụọ.
בני מררי מחלי לבני בנו שמעי בנו עזה בנו 29
Ụmụ ụmụ Merari bụ Mahali, Libni, Shimei, Ụza,
שמעא בנו חגיה בנו עשיה בנו 30
Shimea, Hagiya na Asaya.
ואלה אשר העמיד דויד על ידי שיר--בית יהוה ממנוח הארון 31
Ndị a bụ ndị ikom Devid họpụtara nye ọrụ ilekọta ndị ọbụ abụ nʼụlọ Onyenwe anyị mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ.
ויהיו משרתים לפני משכן אהל מועד בשיר עד בנות שלמה את בית יהוה בירושלם ויעמדו כמשפטם על עבודתם 32
Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.
ואלה העמדים ובניהם מבני הקהתי--הימן המשורר בן יואל בן שמואל 33
Ndị a bụ ndị ikom ahụ jere ozi, ha na ụmụ ha ndị ikom: Site nʼikwu Kohat: Heman, ọbụ abụ. Ndị a bụ nna nna ya ochie: Juel, nwa Samuel,
בן אלקנה בן ירחם בן אליאל בן תוח 34
nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa,
בן ציף (צוף) בן אלקנה בן מחת בן עמשי 35
nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai,
בן אלקנה בן יואל בן עזריה בן צפניה 36
nwa Elkena, nwa Juel, nwa Azaraya, nwa Zefanaya,
בן תחת בן אסיר בן אביסף בן קרח 37
nwa Tahat, nwa Asịa, nwa Ebiasaf, nwa Kora,
בן יצהר בן קהת בן לוי בן ישראל 38
nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, nwa Izrel.
ואחיו אסף העמד על ימינו--אסף בן ברכיהו בן שמעא 39
Asaf onye na-enyere Heman aka, na-eje ozi nʼakụkụ aka nri ya. Ndị bụ nna nna ya ochie bụ ndị a: Berekaya, nwa Shimea,
בן מיכאל בן בעשיה בן מלכיה 40
nwa Maikel, nwa Baaseya, nwa Malkija,
בן אתני בן זרח בן עדיה 41
nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaya,
בן איתן בן זמה בן שמעי 42
nwa Etan, nwa Zima, nwa Shimei,
בן יחת בן גרשם בן לוי 43
nwa Jahat, nwa Geshọm, nwa Livayị.
ובני מררי אחיהם על השמאול--איתן בן קישי בן עבדי בן מלוך 44
Onye ọzọ na-enyere Heman aka bụ Etan, onye ikwu Merari. Ọ na-anọ nʼaka ekpe ya. Ndị bụ nna nna ochie Etan bụ ndị a, Kishi, nwa Abdi, nwa Maluk,
בן חשביה בן אמציה בן חלקיה 45
nwa Hashabaya, nwa Amazaya, nwa Hilkaya,
בן אמצי בן בני בן שמר 46
nwa Amzi, nwa Bani, nwa Shema,
בן מחלי בן מושי בן מררי בן לוי 47
nwa Mahali, nwa Mushi, nwa Merari, nwa Livayị.
ואחיהם הלוים נתונים--לכל עבודת משכן בית האלהים 48
Ụmụnna ha ndị Livayị ụfọdụ ka e tinyere nʼọrụ dị iche iche nʼụlọ ikwu, bụ ụlọ Chineke.
ואהרן ובניו מקטירים על מזבח העולה ועל מזבח הקטרת לכל מלאכת קדש הקדשים ולכפר על ישראל ככל אשר צוה משה עבד האלהים 49
Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.
ואלה בני אהרן--אלעזר בנו פינחס בנו אבישוע בנו 50
Ụmụ ụmụ Erọn bụ Elieza, na Finehaz, na Abishua,
בקי בנו עזי בנו זרחיה בנו 51
na Buki, na Uzi, na Zerahaya,
מריות בנו אמריה בנו אחיטוב בנו 52
na Meraiot, na Amaraya, na Ahitub,
צדוק בנו אחימעץ בנו 53
na Zadọk, na Ahimaaz.
ואלה מושבותם לטירותם בגבולם--לבני אהרן למשפחת הקהתי כי להם היה הגורל 54
Ndị a bụ ala na obodo dị iche iche ụmụ Erọn ketara, nke e nyere ikwu Kohat, ụmụ ụmụ Erọn, nʼihi na ọ bụ ha ka e bu ụzọ kenye oke site nʼife nza.
ויתנו להם את חברון בארץ יהודה ואת מגרשיה סביבתיה 55
Hebrọn, nʼime Juda, ya na ala ịta nri anụ ụlọ niile dị ya gburugburu.
ואת שדה העיר ואת חצריה--נתנו לכלב בן יפנה 56
Ma ala ubi na obodo nta niile gbara Hebrọn gburugburu ka e nyere Kaleb nwa Jefune.
ולבני אהרן נתנו את ערי המקלט--את חברון ואת לבנה ואת מגרשיה ואת יתר ואת אשתמע ואת מגרשיה 57
Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa,
ואת חילז ואת מגרשיה את דביר ואת מגרשיה 58
na Hilen, na Debịa,
ואת עשן ואת מגרשיה ואת בית שמש ואת מגרשיה 59
na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
וממטה בנימן את גבע ואת מגרשיה ואת עלמת ואת מגרשיה ואת ענתות ואת מגרשיה כל עריהם שלש עשרה עיר במשפחותיהם 60
Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.
ולבני קהת הנותרים ממשפחת המטה ממחצית מטה חצי מנשה בגורל--ערים עשר 61
E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.
ולבני גרשום למשפחותם ממטה יששכר וממטה אשר וממטה נפתלי וממטה מנשה בבשן--ערים שלש עשרה 62
E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.
לבני מררי למשפחותם ממטה ראובן וממטה גד וממטה זבלון בגורל--ערים שתים עשרה 63
E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
ויתנו בני ישראל ללוים את הערים ואת מגרשיהם 64
Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.
ויתנו בגורל ממטה בני יהודה וממטה בני שמעון וממטה בני בנימן--את הערים האלה אשר יקראו אתהם בשמות 65
Site nʼebo Juda, na Simiọn, na Benjamin ka e si kenye ha obodo ndị ahụ a kpọrọ aha ha na mbụ.
וממשפחות בני קהת--ויהי ערי גבולם ממטה אפרים 66
E sitere nʼala ndị ebo Ifrem kenye ụfọdụ nʼime ndị agbụrụ Kohat obodo ụfọdụ.
ויתנו להם את ערי המקלט את שכם ואת מגרשיה--בהר אפרים ואת גזר ואת מגרשיה 67
Nʼala ugwu ugwu Ifrem e kenyere ha Shekem (obodo mgbaba), na Gaza,
ואת יקמעם ואת מגרשיה ואת בית חורון ואת מגרשיה 68
na Jokmeam, na Bet-Horon,
ואת אילון ואת מגרשיה ואת גת רמון ואת מגרשיה 69
na Aijalon, na, Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara ya gburugburu.
וממחצית מטה מנשה את ענר ואת מגרשיה ואת בלעם ואת מגרשיה--למשפחת לבני קהת הנותרים 70
Site nʼọkara ebo Manase, ndị Izrel nyere ndị ikwu Kohat fọdụrụ obodo ndị a: Anea na Bileam, tinyere ala ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
לבני גרשום--ממשפחת חצי מטה מנשה את גולן בבשן ואת מגרשיה ואת עשתרות ואת מגרשיה 71
Ndị Geshọm natara obodo ndị a: Site nʼagbụrụ ọkara ebo Manase ha natara Golan, nke dị na Bashan, na Ashtarọt, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
וממטה יששכר את קדש ואת מגרשיה את דברת ואת מגרשיה 72
Ebo Isaka nyere ha Kedesh, Daberat,
ואת ראמות ואת מגרשיה ואת ענם ואת מגרשיה 73
Ramọt na Anem, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
וממטה אשר את משל ואת מגרשיה ואת עבדון ואת מגרשיה 74
Ebo Asha nyere ha Mashal, Abdon,
ואת חוקק ואת מגרשיה ואת רחב ואת מגרשיה 75
Hukọk na Rehob, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ niile dị ha gburugburu.
וממטה נפתלי את קדש בגליל ואת מגרשיה ואת חמון ואת מגרשיה ואת קריתים ואת מגרשיה 76
Ebo Naftalị nyere ha Kedesh nʼime Galili, Hamọn na Kiriatem, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
לבני מררי הנותרים--ממטה זבלון את רמונו ואת מגרשיה את תבור ואת מגרשיה 77
Ndị ebo Zebụlọn nyere ụmụ Merari ndị Livayị fọdụrụ ala ndị a: Jokneam, Kata, Rimọn na Taboa, tinyere ebe ịta nri anụ ụlọ ha.
ומעבר לירדן ירחו למזרח הירדן--ממטה ראובן את בצר במדבר ואת מגרשיה ואת יהצה ואת מגרשיה 78
Ma nʼofe osimiri Jọdan, nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko, ndị ebo Ruben nyere ha obodo Beza dị nʼọzara, nyekwa ha Jahaz,
ואת קדמות ואת מגרשיה ואת מיפעת ואת מגרשיה 79
Kedemot na Mefaat, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.
וממטה גד--את ראמות בגלעד ואת מגרשיה ואת מחנים ואת מגרשיה 80
Ndị ebo Gad nyere ha Ramọt nke Gilead, Mahanaim,
ואת חשבון ואת מגרשיה ואת יעזיר ואת מגרשיה 81
Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha niile.

< דברי הימים א 6 >