< דברי הימים א 3 >

ואלה היו בני דויד אשר נולד לו בחברון הבכור אמנן לאחינעם היזרעאלית שני דניאל לאביגיל הכרמלית 1
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
השלשי לאבשלום בן מעכה בת תלמי מלך גשור הרביעי אדניה בן חגית 2
Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
החמישי שפטיה לאביטל הששי יתרעם לעגלה אשתו 3
Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.
ששה נולד לו בחברון וימלך שם שבע שנים וששה חדשים ושלשים ושלוש שנה מלך בירושלם 4
Ụmụ ndị ikom isii ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn, ebe ọ nọ chịa dịka eze afọ asaa na ọnwa isii. Devid chịrị na Jerusalem iri afọ atọ na atọ.
ואלה נולדו לו בירושלים שמעא ושובב ונתן ושלמה ארבעה לבת שוע בת עמיאל 5
Ndị a bụkwa ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan na Solomọn. Mmadụ anọ ndị a bụ ndị Batsheba nwa nwanyị Amiel mụrụ.
ויבחר ואלישמע ואליפלט 6
Ndị ọzọ bụkwa Ibha, Elishua, Elifelet,
ונגה ונפג ויפיע 7
Noga, Nefeg, Jafia,
ואלישמע ואלידע ואליפלט תשעה 8
Elishama, Eliada na Elifelet. Ha niile dị itoolu nʼọnụọgụgụ.
כל בני דויד--מלבד בני פילגשים ותמר אחותם 9
Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Devid, na-agụnyeghị ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara. Tama bụ nwanne ha nwanyị.
ובן שלמה רחבעם אביה בנו אסא בנו יהושפט בנו 10
Ndị a bụ ụmụ Solomọn: Rehoboam, na Abija, na Asa, na Jehoshafat,
יורם בנו אחזיהו בנו יואש בנו 11
na Joram, na Ahazaya, na Joash,
אמציהו בנו עזריה בנו יותם בנו 12
na Amazaya, na Azaraya, na Jotam,
אחז בנו חזקיהו בנו מנשה בנו 13
na Ehaz, na Hezekaya, na Manase,
אמון בנו יאשיהו בנו 14
na Amọn, na Josaya.
ובני יאשיהו--הבכור יוחנן השני יהויקים השלשי צדקיהו הרביעי שלום 15
Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ.
ובני יהויקים--יכניה בנו צדקיה בנו 16
Ụmụ Jehoiakim bụ ndị a, Jehoiakin nwa ya, na Zedekaya.
ובני יכניה אסר שאלתיאל בנו 17
Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Jehoiakin, eze ahụ a dọtara nʼagha: Shealtiel, nwa ya,
ומלכירם ופדיה ושנאצר יקמיה הושמע ונדביה 18
Malkiram, Pedaya, Shenaza, Jekamaya, Hoshama na Nedabaya.
ובני פדיה זרבבל ושמעי ובן זרבבל משלם וחנניה ושלמית אחותם 19
Ụmụ ndị ikom Pedaya bụ Zerubabel na Shimei. Ụmụ ndị ikom Zerubabel bụ ndị a: Meshulam na Hananaya. Shelomit bụ nwanne ha nwanyị.
וחשבה ואהל וברכיה וחסדיה יושב חסד--חמש 20
E nwekwara ndị ikom ise ọzọ aha ha bụ Hashuba, Ohel, Berekaya, Hasadaya na Jushab-Hesed.
ובן חנניה פלטיה וישעיה בני רפיה בני ארנן בני עבדיה בני שכניה 21
Ụmụ Hananaya mụrụ bụ Pelataya na Jeshaya. Jeshaya mụrụ Refaya; Refaya mụrụ Anan na Ọbadaya, Ọbadaya mụrụ Shekanaya.
ובני שכניה שמעיה ובני שמעיה חטוש ויגאל ובריח ונעריה ושפט--ששה 22
Ụmụ Shekanaya bụ ndị a: Shemaya na ụmụ ya ndị ikom: Hatush, Igal, Bariya, Nearaya na Shafat. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ.
ובן נעריה אליועיני וחזקיה ועזריקם--שלשה 23
Ụmụ Nearaya bụ ndị a, Elioenai, Hezekaya na Azrikam. Ha dị atọ nʼọnụọgụgụ.
ובני אליועיני הודיוהו (הודויהו) ואלישיב ופליה ועקוב ויוחנן ודליה וענני--שבעה 24
Ndị Elioenai mụrụ bụ ndị a: Hodavaya, Eliashib, Pelaya, Akub, Johanan, Delaya na Ananị. Ha niile dị asaa nʼọnụọgụgụ.

< דברי הימים א 3 >